Go Back
Communicating for Change

Document Body Page Navigation Panel

Pages 1--15


Page 1 2
Radio
Vol II No 9 August 1999 [Igbo]

1
CHANGE
NDINAYA Nkeji Ole Ibe
Mmepe
MGBASA OZI

Uzo Ohuru Igbasa Ozi Nnyocha Risaach Nkeji abuo na otu tinkom 6 Uzo akwukwo ozi ohuru gboro ogu ekwe
ekwe di n'etiti ndi okaibe mmepe maka
uzo esibu agbasa ihe e nyoputere na risaach

NKUZI NA MMUTA
Nigeria, Obodo Ndi Ozo Ga-Erite Ihe N'usoro Otu nkeji na tinkom iri ise na otu 4 Akwukwo Uwa Dum

E bunyere mba Afrika di iche iche akwukwo
kariri nde ife n'ime iri aro ato

AHU IKE
Agha E Jighi Ogbunigwu Ime Ala Alu Nkeji abuo na otu tinkom 8 Agha uwa n'ebuso iji ogbunigwe ime ala

alu agha e nwewe la isi

OKWU GBASARA NDI INYOM
Ghana E Weputela Usoro Mbagide Oru Otu nkeji na tinkom ise 12 Inyere Ndi Inyom Aka

Ghana choro iji okwu ga e menyere
ndi inyom doro anya were ba ukwu
afo ohuru

Imegbu Umuntakiri Na – Epu Otu nkeji na tinkom iri ano na otu 13 Ome N'uganda

Aru n'ile a na-akpo n'Uganda bu umuntakiri
na ebula ya

Ndi Ajadu Choro Ikike Iku Azu Na Nkeji abuo na tinkom iri ise na asato 7 Saut Afrika

Ndi ochie ajadu ndi Saut Afrika na-ebu agha ikike
iku azu ga-eme ka nke ha na ndi inyom hara

Ndi Inyom Na Esi Onwu Maka Ikike Otu nkeji na tinkom iri na ato 12 Ihe Ruuru Onye

Ndi inyom odida anyanwu Afrika na-esi onwu
inweta ikike ihe ruuru onye

Gburugburu IKO UGBO
Ahuhu Ubi Choro Itapu Ihe Nri Na Ghana Otu nkeji na tinkom iri ato na ano 9 Akuru ubi di pasenti iri ise ga eyinahu mpahara
arid ugwu Ghana n'afo a
Inata Ikike Nwere Ike Ime Ka Ndi Otu nkeji na iri ise na abuo 5 Ugbo Inine Daa Mba

Otara akpu ijelite n'ogo e weputara ihu na nri
toruru tupu e bupute ya n'ahia. Nke a nwere ike
idoghachi ndi obodo na emepe emepe iso dobite
aku na uba ga-esi n'ahia ohuru na-ekwo ekwo
1
1 Page 2 3
Radio Vol II No 9 August 1999 [Igbo]
2
CHANGE
MGBANWE IHU IGWE
Mmiri Asid Ka O Bu Ekpomooku Mba Uwa? Nkeji abuo na tinkom iteghete 8 Mgbochi mgbanwe ihu igwe a gaghi akwu ekeresu.

o bu otu ndi odi mma gburugburu n'amasi chere

NLEKOTA ONATARACHI/ IWU NRUAKA
Okwu Ekwuru Maka Osinachi Tinkom iri ato na ato 10 Na Mmuo Mmadu

Mmadu kwesiri ihu na ndu ohuru ha anaghi
emegide osinachi uwa.

Zambia Tulere Onodu Gburugburu Ha Otu nkeji na tinkom iri ano na ise 5

IWU ULO
Ndi Mmuta Sayensi Achoghi Ka Aruo Otu nkeji na tinkom iri 5 Oru Mitsubishi abuo na ano

OHIA
Ohia Ghana Tinkom iri abuo na isii 13 Nkenke edemede maka aku na uba

Ghana si n'ohia osisi ha.
ERIMERI
Nduku Oru Ebube Tinkom iri ano na ise 13 Nduku na-eme nke oma n'Amerika

ONYUPA/ MKPAMKPA
Kedu Ka Onyupa Na-Esi N'ugbo Ala Gi Ha Tinkom iri ato na otu 14 Nyomi ohuru maka onyupa ugbo ala

Ndi Gburugburu Ha Churu Oso Tinkom iri ano na ato 14
Ka Ndi Oso Agha Ripot ohuru gosiri na ndi ajo onodu gburu

gburu ha churu oso ka ndi gbara oso agha
Achoro Mgbanyu Oku Ohuru Otu Nkeji na tinkom iri na ato 6
Anaghi Emeru Nmiri Di N'ime Ala Ufufu si na mkpo mgbanyu oku na-emeru

mmiri di n'ime ala.
SAYENSI
Ugbo Elu Nwere Ike Iju N'ala Tinkom iri ise na abuo 13 Ndi oka mmuta ihe elu uwa kwenyere na

ugbo elu nwere ike iju n'ala otu ubochi
ANU OHIA
Oke Anu Bia Gbakarichara Ibe Ya Aji: N'ime Otu nkeji na tinkom iri ano 4 Ofe Ka A Na-Ahukari Ya Karia N'ime Ohia

Anu ohia na agabigazi n'ike n'ike 2
2 Page 3 4
Radio
Vol II No 9 August 1999 [Igbo]

3
CHANGE
Mbe Mmiri Na Ebe Obibi Nkeji abuo na tinkom iteghete 8 Ya No Nkeoma
Ilekota umu anumanu na-enyere ebe obibi ha aka

Mpaghara Umuntakiri
Mbe Na Mkpuru Akwu Nkeji ise na tinkom abuo na ano
10 Ka anya ukwu na ire abuo si nyu ezi na ulo
mbe anya
Nnunu Odu Ogologo Furu Efu Nkeji ato na tinkom iri 11 Akuko ndebele saut afrika kowara abuo na out

ka rino si akpasa nsi ya
Onye Eke Turu, O Nwere Ike Ime Otu nkeji na tinkom asaa
11 ka agwo ghara itu ya ozo?

Na paiton turu gi agaghi igbochi agwo ndi ozo
itu gi

Ngwere Oma Ama Akabi Odu Ya Tinkom iri ise 12 Iji Gbanahu Ndi Choro Igbu Ya?

Choputa ihe kpatara ngwere ji akabi odu ya
ha a na-akpacha anya ka o bu ihe mberede?
3
3 Page 4 5
Radio Vol II No 9 August 1999 [Igbo]
4
CHANGE
Akuko
Nigeria, Obodo Ndi Ozo Ga-Erite Ihe N'usoro Otu nkeji na tinkom iri ise Akwukwo Uwa Dum na otu
Mba Afrika asaa, tinyere Nigeria bu ndi ndi oru nwere onwe ndi Amerika bunyekarichara akwukwo ha na-enye ndi obodo na-emepe emepe kemgbe afo 1962. Obodo ndi ozo bu Zimbabwe, Zambia, Uganda, Liberia,
Ghana na Ethiopia.
Saut Afrika a gunyere ohuru tuuru ugo ndi ebunyere akwukwo nke nde iri ano. Ndi otu ahu kporo onwe ha Brodas Broda Faundeshon BBF na bekee e teela ha bunyewere obodo n'emepe emepe iji nyere ha aka "igu
akwukwo na itoru ebe mba ndi ozo torugoro n'igu akwukwo" dika Mazi Luke Hingson bu Prezidenti ha siri kwu.

Ndi otu a na-eke akwukwo ruru nde iri ato kwa afo n'obodo n'emepe emepe. Ha e buuyela Afrika akwukwo kariri nde ise.
N'okwu ozinyere ndi oru mgbasa ozi Amerika kporo onwe ha Unaited Stets Infomeshion Ajensi (USIA), o
siri, "ihe ruru nde abuo ka ha bunyere ndi Zimbabwe, otu nde gaara ndi Liberia ebe nari puku isi laara ndi Ghana. Ndi ozo natakwara oke buru ibu bu Zambia, Uganda, Nigeria na Ethiopia"

Otu ulo oru na-ebi akwukwo mere na enye m aka ndi BBF nwere isi ruru iri ise. Ha bu Lippincott – Raven, McGraw-Hill, Simon na Schuster, Scott-Foresman na – ede ihe umuntakiri, Zana Blosa na John Wiley na umu
ya. Ndi ji ego akwado ha bu ndi Ajensi Amerika na-ahu maka oru mmepe, (USAID). Ndi oru akom ugbo di n'aka, ndi USIA na ndi na-ahu maka ibu ihe si na mmiri oshen.

Ndi – obodo ana ebunye akwukwo ahu na-enyekwa aka. A na-egosi ha akwukwo n'ile ahu tupu ha ewere aka ha horo ndi baara ha uru.
Newslink Africa (Niuz Link Afrika).
Oke Anu Bia Gbakarichara Ibe Ya N'aji – Otu nkeji na tinkom iri ano N'ime Ofe Ka Ana Ahukari Ya Karia N'ohia
Bia ahu, buru ibe, na eri anu ibe ya, gbara aji nke ukwu, nwere mbo roro aro o ji eri ndi ozo ka a na-acho n'ike n'ike n'ihi iji ya me nri na ogwu. O bu ndi WWF, ndi ji ego akwado odi mma ihe bi n'ohia uwa dum kwuru nke
a mgbe ha mere ntule ihe gbasara onodu bia nke mbu uwa dum.
Ha kwuru na igbu osisi, ichu nta, nzukorita ahia ofesi na agha so eme mila ha.
Ichu nta memilara agburu ato ndi Eshia kporo Slot, sun na blak tumadu sun anakwaghi ahuzi anya n'India. Iko
ugbo na ahia ogwu na-emela nke grizli na Mexico. Abia n'Urop na Not Amerika, ese m okwu di n'etiti mmadu na anumanu na izu ahia so egbu ha.

Amaghi maka bia n'Afrika. Ndi ahia mba ofesi Eshia, Yurop, Not na Saut Amerika jikwa ya aru ogwu ndi Chaina ji agwo oria obi, umeju na hemoroid ka o na e wuru. WWF kwukwara n'akwukwo ha deputara na
July 27 na anu ahu na-atokwa uto iji mee nri. 4
4 Page 5 6
Radio
Vol II No 9 August 1999 [Igbo]

5
CHANGE
Nwada soro de edemede "Achoro ya n'andu, Bia di n'ohia" bukwa onye isi inweta na igbasa ozi na WWF bu Elizabeth Kempt siri "N'ahia Eshia ka anu bia bu aturu tawa," ka onu ogu ha na-agbada ka ndi na-azu ahia anu
n'Amerika na-acho ndi ozo." WWF.

Ndi Mmuta Sayensi Achoghi Ka Aruo Otu nkeji na tinkom Oru Mitsubishi iri abuo na ato
Atumatu ohuru ndi ulo oru Mitsubishi choro iji wuo faktri nnu na Mexico e meela ka ndi oka mmuta sayensi si mpahara uwa dum ruru iri ato ju na agaghi aru ya. O bu na Laguna San Ignacio ndi UNESCO bara ebe nrite
uwa dum agaghi akpa aka n'afo 1993 bu kwa ebe obibi ikpe azu azu weel mmadu emetobeghi ka ha choro iwu faktri ahu.

Ndi Mitsubishi choro imipu puku galon mmiri isii kwa otu tinkom ga-eme ka ala di otu skwua mita na iri na isii buru ala odo mmiri. Ndi sayensi ahu siri na oru ahu ga-emekpa gburugburu ahu. Ha gooro ohere n'ibe
akwukwo akuko Niu Yok na Guardian San Francisco Bay na La Rifoma ndi Mexico were akato ibido orua.
Onye bu okwu a n'isi bu nwoke ahu ama ama nyoputere na azu mkpumkpu azu weel na-agu egwu dere
akwukwo ahu ha ji ju ya bu atumatu. Akwukwo ahu siri "Mitsubishi kwesiri isopuru ihe ha bu ndi oka mmuta sayensi kwuru karia ebumnobi ha iji ebe ikpeazu weel Kalifonia ahu mere faktri nnu."

Agiptrop.

Zambia Tulere Onodu Gburugburu Ha Otu nkeji na tinkom iri ano na ise Zambia nwere osisi na anumanu di iche iche ruru puku asato be ha. Ntule ihe ohia be ha, ha mere gosiri n'ime
ohia ha n'elekota anya di nari ise nwere ihe obibi di iche iche ruru iri na isii, Nashonal Pak, ebe obibi umu nnunu na ebe egwuri egwu.

Ebe nlekota anya kpaara bere ihe n'okara obodo ahu nile di sukwuia kilomita nari puku asaa na ise. O bu ndi otu (CBD) na-ahu maka ihe di iche iche di ndu n'ebe obibi ha weputara nto ala ha ji me ntule ahu. Ndi
Komishon ahu gwara ndi otu ha niile ka ha guo anu na osisi di iche iche di be ha onu, ka ha were mata ma ha anokwa nke oma, ihe e ji ha eme tinyere ma a na-emekpa ha ahu.

Ntule ahu gosiri onodu egbe bere di n'etiti osisi na anumanu na Zambia. "Ohia bu ebe obibi umu anumanu, ebe umu anumanu na enye aka ime ka mkpuru osisi mia, chisaa ma puo ome." Ihe ebe ahu na enyekwara aka imezi
mmiri, igbochi mbuze, idozi ihu igwe na ikeputa mkpuru nri.
Obu Profeso okwu ebe obibi doro anya na Zambia bu Emmanuel Chidumayo gbasara ihe ntule a n'akwukwo o kporo: O di ole bu ihe ahu. Ndi ji ego kwado ya bu ndi oru gbururugburu uwa bu Global Enviromental
Fasiliti (GEF) site n'enye m aka ndi otu mba uwa okwu mmepe di n'aka bu (UNDP) na nke nke. A ga-eji ya
bu ihe atuletara were welite onodu ebe ohia Zambia. KOBUS.

Inata Ikike Ga-Eme Ka Ndi Ugbo Inine Daa Mba Otu nkeji na iri ise na abuo Ndi Amerika na ndi Yurop a chozighi nri o bula ogwu ebe metogoro. Abia n'obodo n'emepe emepe, ha
nwere olile anya iso dobite elele ga-esi n'ahia ma iwu megidere isi ofesi bulata ihe nri ndi Yuropian Yunion tiri 5
5 Page 6 7
Radio Vol II No 9 August 1999 [Igbo]
6
CHANGE
ga-eme ka iko ugbo n'ejighi ogwu KemiKaal ghara inwe isi n'obodo ndi n'emepe emepe. Nke a mere ka ha na ebogide ndi Yurop ebubo na obu mmegbu ka ha kpachara anya emegbu ha.

Iwu ndi EU ahu ka a katoro na omuchiri anya ju ihu onodu obodo n'emepe emepe na ndi olu ugbo opeka mpe no. N'ima atu, isi ha kabie ubi ha na ohia akobeghi nri bu ihe ha katoro na o bu ime okomoko ha e nweghi ike
ibagide.
Ihe mgbache uzo uzo chebiri ha bu kwa ikwu ndi ononetiti Konzultant no na Yurop ugwo ka ha were mata na ha na agbaso usoro ha kwuru site na ripot ndi ononetiti ahu ga-ede maka ha.

Nick Robins onye ulo oru na-ahu maka gburugburu na mmepe di na London so de edemede maka igbanwe usoro e si ako na ka esi eri ga eme ka azumu ahia ruo onye obula aka kwuru si, "inweta ikike iba ahia ndi Yurop
garara onu tinyere chere ka m bia ndi oru ugbo opeka mpe Saut agaghi agabigali."
N'agbanyeghi na ahia ihe ubi oganik ahu eruola bilion dola iri na otu, o ka na agbasa kwa. Ndi Afrika a
matabeghi maka ahia, mana Saut Amerika e jikewela imiwa umi ya. Nani Chile na ebupu ihe ahia ruru otu nari puku abuo n'afo 1998 ritere ihe ruru nde dola ato.

PANOS

Mgbanyu Oku Ohuru Anaghi Emeru Otu nkeji na tinkom Mmiri Di N'ime Ala iri na ato.
Ufufu si na mkpo eji agbanyu oku mgbe ihe mberede ugbo elu mere na emeru mmiri ime ala. Ndi nyocha risaach siri na aku si n'ugbo elu ahu ihe mberede mere na ebu mmanu mmiri anaghi asachapu li. N'ihi ya
emeputara ufufu akwuios bekee kporo Akwuios Fim Fomin Fom AFFF na ebu uzo fesaa mmiri n'elu oku mmanu ahu.

Ihe e ji ghara inabatacha AFFF bu na o bu florokabon na haidrokabon e ji aru nkpo erosol, kol na mmanu na emeto gburugburu.
O bu nwada Mahadum Oregon di n'Amerika bu Dokita Jennifer Field choputara ihe na eme AFFF agbara n'ikuku. O choputara n'ufodu n'ime ha fekpuru ime mmiri na-agbo ufufu.
Ihe omumu a na-eme ugbu a bu imata ka AFFF si emegide ahu ike mmadu. Enviromental News Network.
Nkomi Uzo Ohuru Igbasa Ozi Risaach Nkeji abuo na otu tinkom
Edeputala akwukwo gosiri ka a ga esi na agbasa ozi risaach mmepe ka o ruo ndi ogbenye na ndi otu nnochite anya ha nti ga enyere ndi goomenti, ndi oru mmepe na ndi nnyocha aka.

O bu ndi nnyocha mahadum Loughborough weputara usoro a, onye deputara ya bu Darren Saywell na A P
Cotton. Ka akwukwo ahu siri kwu, "Onye oru ngo risaach n'agba mbo ihu na ihe onyoputere laara onye nyere ya ego o ji me nnyocha karia ezi okwu di n'ihe onyoputere."

"Ihu na ozi ruru oha na eze aka tupe e bido nnyocha, n'ime nnyocha na ka e mechara", dika akwukwo ahu 6
6 Page 7 8
Radio
Vol II No 9 August 1999 [Igbo]

7
CHANGE
dekwara", ga eme ka mmuta si na ya zuo oke tinyere akparamagwa gosiri na onwere ihe esi na ya muta".

Aro ozo ga-eme ka ozi zuo oke bukwa ihu na ama ebe ndi a na ezigara ozi no ya na n'ozi na-eru ha aka n'onu ala. Ihu na obughi naani otu uzo mgbasa ozi ga eme kwa ka o di ire. Ndi dere akwukwo ahu na-echekwa na
ime ka ihe enyoputara rue oha na eze aka ga na-aga n'ihu mgbe dum ka o were buru ihe a ga n'eletiri anya
were akwado oru mmepe obula. idzi Report.

Ndi Ajadu Choro Ikike Iku Azu Na Saut Afrika Nkeji abuo na tinkom iri ise na asato Umu nwanyi ajadu ruru iri na ano na Kep Taun, Saut Afrika na-azo ikike ha ga-eme ka ha na-aku azu ka umu
nwoke. A naara ha ikike iku azu mgbe di ha nwuchara ka ha were na elekota ezi na ulo ha anya site na nwa
nchoncho ego ha na e nweta na ntakiri obodo ha bu Kalkbee.

Ebumnobi ndi ajadu a Sybil Edward di afo iri asaa na ato tinyere ndi ogbo ha mmadu iri na-ato ndi ozo afo ha di ga-abu site na iri afo ise na isii rue iri afo asato na asato bu na ha nweta ikike a, ha ga enye ya ndi umunwoke
ga na-akuru ha azu.
Mana kemgbe afo 1994 ha dere akwukwo ihe ha choro, e gebeghi ha nti. Oriaku Edwards, nke di ya nwuru anwu, kuru azu n'obodo ha afo iri ano tupu onwu o siri, "anyi aghotaghi ihe kpatara na ha agaghi enye anyi
ikike a, anyi buzi ndi oji anya ele gara chukwu Anyi atukwasala okwukwe anyi ebe ono."
Obu ndi na-ahu maka iku azu bu fishri Kansul e guzobere maka ihu na a nabatara ndi ohuru ka ha degaara akwukwo ahu. Ndi na enyocha ndi a ga enye ikike asambodo bu ndi nlekota mmiri. Ndi a ga enye ikike
imalite oru bu Minista okwu gburugburu na njem nleghari anya di n'aka.
Okwuchite onu ndi ajadu a bu Melody Kingma, siri na ebumnobi ndi ajadu ahu bu iji ego ha ga enweta ma ha
rechaa azu ahu ha na ario ikike ya, bu iguzobe ulo ogwu na ebe enyem aka maka ndi ajadu na ndi orusi na Kalkbee. Otu n'ime ndi ajadu ahu bu Oriaku Gainssa Fortune siri na ndi inata ikike ahu di n'aka enwebeghi ka

ha si kowaara ha ihe kpatara na ekweghi enye ya ihe ha rioro.
"A na m eche na ha achoghi ikenye anyi ego ha na-erite na ya" Ihe ndi ajadu ji adi ndu bu nani otu nari dola,
ego a na-akwu ndi lagoro ezumike nka. Nani ufodu n'ime ha ka o na ezuru nri. Ufodu si kwa n'ime ya edota nke a ga eri echi. O bu n'ime ya ka Monika Collison di afo iri isii na asato si zuo umu asaa ka di ya nwuchara

afo iri abuo gara aga.
Nwanyi a siri na Kalk bee e nweghi ulo ebe a na-ere ogwu, ebe a na-egbu anu, ebe a na-esi achicha bred.
Nke a mere ka ha na-eje ebe tere aka egbo mkpa n'ile ndi ahu. Ujo ha bu na ahu ria ha, odighi elem anya ha nwere ga esi n'aka be ha bia.

Wilhelm Kroon, osote onye isi n'ulo oru mmiri na Kostal manejment, be ha e nweghi ike ikowa ihe e jibegh nye ha ihe ha choro. "Ha mezuo ihe iwu kwuru, ha ga enweta ihe ha choro. Ya bu achicha buru ibu, otutu ndi
mmadu choro ya ga e nweta ya." Afrika Niuz On Lain. 7
7 Page 8 9
Radio Vol II No 9 August 1999 [Igbo]
8
CHANGE
Agha E Jighi Ogbunigwe Ime Ala Alu Nkeji abuo na out tinkom Ogbunigwe ime ala kariri nari nde abuo na iri ise ka na-ekume. Ogbunigwe a bekee kporo Anti-Pesinal
Landmain (APL) bu naani nde iri na abuo ka ebibi goro kemgbe ebuwere agha ibibi ha dum. Pasenti iri n'onu ogu uwa dum na-aria orusi di iche iche. Otutu n'ime ha bu ogbunigwe ala na puru ha akuku ahu ha.

N'ima atu, kemgbe 1997 bere ihe n'obodo niile tinyere aka n'akwukwo n'ogbako Maputo Mozambik, inwe, iru na ibusa ya bu APL, naani obodo iri ato na asato n'aru ya bu ogbunigwe seligoro aka. Iri na isii ndi foro afo
nogodi juu. N'ime iri obodo ato na ano na-esi ofesi ebulata ya, naani Iraq bu ndi ka na-aga n'ihu. Nke ka mkpa bu na ndi na-alu agha anakwaghi eji ya.

Akwukwo edeputara na e gosi mbo a na-agba ikwusi iji ogbunigwe a lu agha bu Land Main monito ripot 1999 maka ikpochapu ogbunigwe n'uwa, bu ndi Land main monito koo grup, ndi ha na ulo oru choro igbochi
ogbunigwe jikoro aka dee na egosi na emebiela nde kwurunde ogbunigwe, kwusilata iruputa ya ma kwusi ahia ya kpam kpam. Ndi oru risaach ruru iri asato si otu nari obodo tinyere ndi oru mnwere onwe NGO di otu puku
na nari ato nyere aka di iche iche were biputa akwukwo ahu ibe ya di otu puku na otu nari.
Ndi dere akwukwo ahu kwere nkwa na ha ga na eme ka oha na eze mata ebe okwu a jedewere mgbe nile ka
e were ya mere ihe ejimaka maka ikwusi mmeputa ya bu ogbunigwe. News Link Africa

Mmiri Asid Ka O Bu Ekpomoku Mba Uwa? Nkeji abuo na tinkom iteghete Mbo a na-agba ibelata onyupa na-esi n'indostri emeto ikuku ga-ama afo n'ala ma o buru na ihe otu onye
profeso na Mahadum Ilinos, USA bu Michael Schlesinger nyoputara bu ezi okwu. O siri na mbo a na-agba ibelata mmiri asid ga eme ka-ekpomoku ka wanye njo.

O bu Solfo daiogzaid na Kabon daiogzaid, Kemikal abuo na-esi n'ugbo ala na ndostri na ebute ekpomoku a. O na abu ha ruo n'ikuku, ha na mmiri na ikuku e jekoo buru mmiri asid. N'ikwusi mmiri asid, ndi ndostri
belatara aka ka ha si e ji sulfo daiogzide aru oru. Ya mere na a na-enwe ekpomooku n'uwa.
Ebe kabon daiogzaid na egide anyanwu, welite onodu ikuku, sulfo daiogzaid na mmiri na ikuku jekoo onu, uwa ajuo oyi. Ndi na-agba mbo ka ikuku mba uwa dikwa mma bu ndi Panel Gomenti maka mgbanwe ihu igwe
(IPCC) kwudooro iji kemikal abuo ahu were kwusi mmiri asid.
"O di nwute na I na-agba mbo igbochi otu nsogbu gbururugburu, ozo esi na ya puta" "O dizi ka ibelata onyupa Solfo na-ebute mmiri asid na-ebute kwuazi ekpomoku n'ebe e wepuru ya bu Solfo," Schlesinger kwukwara.

Ihe omumu Schlesinger na ndi otu ya mere gosiri na ibelata solfo daiogzaid butere ekpomoku na Not Amerika,
Yurop na Eshia. Environmental News Network (Enviromental Niuz Network)

Mbe Mmiri Na Ebe Obibi Ya No Nke Oma Nkeji abuo na iteghete Ihe aka ebe na-egosi na anumanu na ebe obibi ha na-ebi ndu egbe bere ugo bere. N'ima atu, mbe mmiri ji ebe
obibi ya n'akuku oshimili adi ndu. Ihe enyochaputara ohuru gosiri n'akuku oshimili ahu enweghi ike ime nke oma ma oburu na mbe ebighi ebe ahu. N'Amerika, mbe Logahed na-aga ihe ruru puku kilometa abuo iyi 8
8 Page 9 10
Radio
Vol II No 9 August 1999 [Igbo]

9
CHANGE
akwa ebe ahu ekpuru ha. Ndi o dimma gburugburu n'amasi na-agba mbo ilekota ebe ahu. Nwata akwukwo Mahadum Florida (UF), Sarah Bouchard mere nyocha na bich Melbon Florida siri na akwa Mbe mmiri ahu
nwere ihe na edozi inine ebe ahu obi, dozie aja di ebe ahu ma zuo kwa otutu ihe bi ebe ahu nri.
"Nshiko, nnunu, na anu ndi ozo na eri akwa ya. Ha na akpasasikwa ya n'aja ebe ahu' osisi puru ebe ahu n'amiri kwa nri si n'akwa ahu, mmiri akwa ahu salara n'ala na-azu kwa aja ahu, o bu Bouchard nyoputere ihe
ndia. Mbe mmiri na-eyi akwa kariri nari puku isii na iri ise kwa afo ebe ahu na esi ebe ha na-akpa nri na Bahamas, Kuba, Ripoblik Dominika, florida, na ebe ndi ozo di na Karibian rue ebe ha na arahu.

Ihe omumu aga eme n'ihu bu I mata ihe ga eme ebe ahu ma mbe ahu kwusi ibi ebe ahu. Environmental News Network (Enviromental Niuz Network).
Ahuhu Ubi Choro Itapu Ihe Oriri Na Ghana Otu nkeji na tinkom iri ato na iteghete
Ahuhu otu nri awakpola notan rijon Ghana ato, dara soghum, oka, egusi na osikapa tapu, otutu anumanu tara inine ha no na ya nwunyuru anya. Ahuhu ahu ebibiela hekta ubi ebe owuwa anyanwu upa rijon di nari puku

asaa na abuo, jide hekta akuru ubi di n'odida anyanwu ebe ahu di puku iri tapu. N'ime rijon a, ebe isii ka o jisi ike.

Minista ebe ahu bu Alhaji Amidu Sulemana nwute ya bu na ahuhu a ga ekpochapu akuru ubi pasenti iri ise be ha siri "mgbanahu na na notan rijon a bughi ihe eji n'aka" o rio kwara ka gomenti ha buteere ha ogwu ha ga eji
memila ahuhu ahu.
Ihe na ebute ahuhu ahu bu mmeto gburugburu na uko mmiri ozuzo. Otu onye ministri akom ugbo siri na otu
nnukwu mmiri ga-ezo ga ekpochapu ha n'otu ntabi anya.

Mgbe osoto onye isi obodo bu Profeso John Atta Mills gara njem ebe ahu, o kwere ha nkwa akuru ubi ozo na fetilaiza o ga enye ndi tichapu chagoro ahuhu ahu n'ubi ha.
Ka o di ugbua, otu oru na-ahu maka oghom mberede na Ministri okwu nri na iko ugbo di n'aka na Ghana bu
agha igbochi ahuhu a n'isi. A na-ekpekwuazi ekpere n'ulo uka di iche iche ka mmiri zoo. Edward Ameyibor.

Ghana – Otu Ulo Oru Kpebiri Ikwusi Isu Ohia Nkeji abuo na tinkom iri ano na otu. Ghana a subiela uzo abuo n'ime uzo ato ekere ohia ha. Ugbu a, o foola ha n'anya n'ihi na ha e kpebiela ibagide
nlekota onatarachi ha iwu ahu ha mara igbu osisi kwa afo iri na ise ka e ji zi iwu igbu osisi kwa afo iri ano mebie.
Uzo ozo ha si abagide nkwusi a bu mmachi ire osisi mahogani na timba udi ya di iche iche ruru iri na ano n'ahia ofesi. Ntule ha mere gosiri ha na iwu ahu egbochighi ndi ahia osisi ohi. Ohia Ghana si na hekta nde iri abuo na
ato o di n'afo 1901 daruo bere nari nde asaa na nde iteghete taata. Ndi goomenti na ndi odi mma gburugburu na-amasi e forola ntutu taa maka ilekota ohia ha.

Ofisa ohia offinso di n'Ashanti bu Mazi Walter Gyabaah – Atuoni siri, "afo iri ano eweputara bu mgbe osisi ndi ahu ha na ere ere di iri na ano were topute, kata ahu." Ha na-agbo mbo ihu na edobere iwu ahu n'agbanyeghi
na mgbe ufodu, ha na ndi ohi osisi ji egbe na akwata n'abali.
Ulo ikpe mara ndi ohi osisi ato ohuru a otu nari dola na isii putara nari puku cidis ano, nara ha igwe ha ji akwo 9
9 Page 10 11
Radio Vol II No 9 August 1999 [Igbo]
10
CHANGE
osisi di otu nari na iri na ato ha zuru n'ohi. Ministri ala na ohia di n'aka siri na aku na uba na efunahu ha n'ohi osisi ruru nde dola iri. Ka o di ugbua, ndi
oka iwu be ha choro ima iwu ka nke ugbua taa akpu. Ugbua mmiri ozuzo tugoro ala, oru iku osisi ka ha bagidere. E guzobela onye kukaria o turu ugo n'ulo akwukwo di iche iche, ndi oru mnwere onwe NGO na-agbasa
ozi oma mgbochi mmebi gburugburu. Ndi oru osisi na otu oru ihe ubi nke Tred Union Kongres (TUC) choro ka a machie ibupu osisi n'ahia ofesi mana gomenti ha di ka ha a ga anyu nti mmanu n'ihi ahia osisi a bu
uzo nke ano na enyekari ha ego.
Nke a bu nsogbu chere Ghana. Gomenti na-agba nbo ichekwa gburugburu na ndu ihe bi n'ime ya, mana ahu
ya choro ego dola maka isi ofesi bubata ihe ha enweghi. Edward Ameyibor.

Nkomi Puru Iche Okwu Ekwuru Maka Osinachi Na Muo Mmadu Tinkom iri ato na ato
"Otu n'ime ihe chere ndi nlekota onatarachi aka mgba bu ihu na akparamagwa ndu ohuru anaghi emegide ka esi akpa ego na ibi ndu ga-ewelite onodu aku na uba di n'etiti obodo nepe emepe na ino ezumike n'ime obodo,
ihu na emetoghi oshimili na mgbada ugwu, na inwe anuri ma a na-ekiri ka nnunu si efeli." Konzaveshon Kwoteshon/ George B. Hertzog. Onye isi pak ndi Amerika.

Mpahara Umuntakiri Mbe Na Nkpuru Akwu Nkeji ise na tinkon iri abuo na ano
Mgbe ezi di n'ukwu ukwa ugani di n'obodo umu anumanu Nri koro uko, umu anumanu, nnunu na ahuhu n'anwucha n'aguru. Ihe oriri n'ile di oke mkpa. Umu anumanu niile bu nta nri ka ha na-achuzi.

Otu ubochi ebe mbe na-acho nri, o huru otu mkpuru akwu. Ka o tututara ya, o dana huru ya, dakpuo n'ime onu didewere ukwu nkwu. Mbe siri onwu rikpuo ime onu ahu iweputa mkpuru akwu ahu. O huru otu mmuo
juo ya maka mkpuru akwu ya. Muo ahu gwara ya na nwa ya ataala ya.
Mbe malitere akwa, si na ya ga egbu onwe ya ma enyeghi ya mkpuru akwu ya. N'amgbanwe o siri si kpunye ya ada mmuo ahu ka ha riogidere ya o ju, ha bunyere ya otu " igba nri" Mgbe obula e tiri igba ahu, nri di iche
iche na-esi na ya aputa. Muo ahu dokwara ya aka na nti ya asakwala igba ahu mmiri n'ihi na-asaa ya mmiri o gaghi etiputakwa nri.

Mbe kelere ha, buru ya laa, kpokoo ndi nwunye ya na umu ya, kpochie uzo. O kuru igba ahu, nri di iche iche, eju ulo ha, ha rijuo afo. O gwakwara ha emela ka onye obula nu ya ma sikwa ha asala igba ahu mmiri.
Ka anumanu ndi ozo na-ata ahu, mbe na ndi be ya na ebu ibu. Ndi ozo juo ya, o si ha na o bu nne ya nwuru anwu na enye ha nri na onye choro ka o di otu ahu gaa gbuo nne ya. N'ihi na ha atukwasighi mbe na ndi be
ya obi, o dighi onye kwetara na o kwuru ezi okwu, o dikwanughi onye gburu nne ya.
Ka o gara ntakiri oge, mbe gawara njem di anya, ndi nwunye ya were igba ahu saa mmiri, gbaa ya n'anwu n'udi na ha ruru ezi oru. Mgbe aguru jidere ha, ha tiri igba ahu ma nri aputaghi. O zi ruru mbe nti, mgbe o
laruru, o puru njem ibute ozo.
O gara ebe ahu o nwetara mkpuru akwu ka o ruru, o hukwara ozo, nke o mara uma tunye n'ime onu muo ahu 10
10 Page 11 12
Radio
Vol II No 9 August 1999 [Igbo]

11
CHANGE
na akwu ahu abarughi be muo. Mana mbe banyere ebe ahu bo nwada nwa muo na o tala akwu ya. Ha gooro isi ha, ga weta akwu ahu ebe o di nye ya, ma o siri na o bughi nke ya ma na o buru na ebunyeghi ya igba ozo,
ya egbuo onwe ya. Mana, o gbajoro ya – n'ihi na osighi onye muo ahu tie igba ahu ka ya hu, tupu o buru ya laa.

Ka o ruru ulo, o kpokuru ezi na ulo ya ka oge ubu, kpochie uzo, tie igba ahu. N'ihi na ha kpochiri uzo, anwu jiiri ha suo akwu, ha kubichara, e buru ha gaa ulo ogwu. Ihe akuko a, na-ezi anyi bu ikwuba aka oto ma na aju
iwe ihe abughi nke anyi. Akuko eji akpu agwa oma ka anyi were buru ndi oma n'obodo.

Nnunu Odu Ogologo Furu Efu Nkeji ato na tinkom iri abuo na otu
Mgbe gara aga, Enyi na Rino nwere nghotahie mere ha jiri luo ogu. N'ihi na ha abuo na ewe iwe oku, Rino meruru enyi ahu otutu mgbe ma iwe oku ya mere ya aru.

Enyi jiri nwayoo jide iwe ya aka, tinyere na o ka ibu, ma sikaria ike, o meriri Rhino, dokasia ya ebe di iche iche. O bara na-agba Rino nke ukwu, o jere rio pokupain ka onyetu ya otu nku ogologo ya ka o were ya kwaa ebe
o meruru ahu.
Nnunu ahu gbara iwe ka esi metee ya n'ura ma na o mere ka Rino kwe ya nkwa na o ga eweghachiri ya
ogologo nku ya ma o mechaa. "O gologo nkum a, ka m ji agbalahu onye irom bu agu, I ga ekwem nkwa na I ga eweghachi ya azu."

Rino kwetere ma ka o kwachara ahu ya, o togboro ya otu nga lakpuo. Otu mgbede, Rino huru nnunu ahu were cheta ogologo nku o natara ya, tie mkpu si "o ga-abu na m elomiela ya." O kpebiri na o burugodi na ya
lomiri ya, mgbe adighi anya na ya ga agboputa ya. O rio ro nnunu ahu ka o nye ya o bere oge na ya ga eweghachi ya.

Ya mere Rino ji akpasa nsi ya ruo taa ebe o na acho nku chakeleke. When Hippo was Hairy – Mgbe Hippo gbara aji.
Onye Eke Turu, O Nwere Ike Ime Ka Agwo Otu nkeji na tinkom asaa. Ghara Itu Ha Ozo?
O bughi ezi okwu. O nweghi ihe ga egosi na eke tuo mmadu na onwekwaghi agwo ozo ga atu ya otu ndi owuwa anyanwu Afrika si ekwu. N'agbanyeghi na eke na-ata ata, ha so n'otu agburu agwo na adogbu ihe
oriri ha adogbu tupu ha erie ya.
Aru anumanu ndi ozo tara mmadu nwere ike ibute re onye ahu oria. Iyie eke ujo, o na-ata aru ma o nye o tara nwuo, o bughi maka poisin o gbanyere onye ahu n'ahu ka ma o bu na nje bara n'onya ahu o tara onye ahu.
Mgbe ufodu, o na-abu ujo ya na egbu ndi o tara. O ka mma na ileghaara agwo anya ma o buru na imaghi anya
ha tupu ihujuo anya. Chongololo. 11
11 Page 12 13
Radio Vol II No 9 August 1999 [Igbo]
12
CHANGE
Ngwere Oma Ama Akabi Odu Ya Iji Tinkom iri ise. Gbanahu Ndi Choro Igbuya
Nke a bu ezi okwu. Otutu ngwere pere mpe ma ha nwere ndi iro. Ike oso ha, mgbanwe na mpiada odu ha, ka ha ji agbanahu nwamba, agwo na nnunu. Ndi sayensi choputara na onwere ebe odu ngwere nwere ike
igbajipu. Odu ya, gbajipuru na-atu akpiri.
Agburu Ngwere di n'uwa di puku ato. Ha bu agburu agu iyi na agwo. Otutu n'ime ha bi ebe na ekpo oku na-eri ahuhu na ndudo.
chongololo

Okwu Gbasara Ndi Inyom Ndi Inyom Na-Esi Onwu Maka Ikike Ihe Ruru Onye Otu nkeji na tinkom
iri na ato
Otu umu nwanyi asato n'odida anyanwu Afrika mere mmeme ncheta ubochi inata ikIke ihe ruru onye na
Bokina Faso, Kamerun, Gambia, Ghana, Liberia, Nigeria, Senegal, na Togo ka ubochi di na 29 n'onwa Jun n'afo 1999.

O bu ndi otu oka ikpe ikike onatarachi no na Washinton kwadoro ha. Atumatu a bidoro n'ogbako ndi oka ikpe a guzobere na Ghana n'onwa November 1998. N'ogbako ahu, ka ha kwetara usoro ha ga-esi bido inata
ike ga enyere ha aka gbochibe nsogbu ha.
Marie-Elena John Smith bu onye na-ahu maka oru otu a n'Afrika choro ka ndi inyom kee aji n'ume, tisie mkpu ike ka ndi ofesi nu mkpu akwa ha.

"Akparamagwa a na agawanye n'ihu n'agbayeghi iwu obodo na egbochibe ndi inyom ha ga-eme ka ha na eketa ihe opekampe na ebute ubiam nde kwuru nde udi inyom na umuntakiri." Ndi otua na agbasa ozi
edemede ha degaara ndi otu mba uwa, UN, OAU, ha ji ekwu ka a machie iwu na emegide mmegbu umu nwanyi.
International Human Rights Group – Otu na-ahu maka iwu mmegide ikike onatara chi.

Ghana Eweputala Usoro Mbagide Oru Otu nkeji na tinkom ise Inyere Ndi Inyom Aka
Kansul okwu onu ogu obodo na Ghana choro itinye anya ebe ndi inyom na umu agbogho no n'ukwu afo di n'ihu. Mgbe o na-ekwu okwu n'Accra, Richard Turkson bu ode akwukwo kansul ahu siri na inye ndi inyom
ike nkwalite, ikuziri umu agbogbo akwukwo na iwepu afo ime so n'okpurukpu okwu ha ji mere isi ozi.
Kansul a na ndi gomenti, ministri ajensi na ndi NGO ga abagide ikuziri oha na eze ihe gbasara oke na nwunye ga eme ka ubara mmadu belata. Mmeri kansul a nwetara na mbu bu nto ala oru, usoro ahu ike, nto alo atum
ime mgbasa ozi na odi mma umuntakiri nke ndi oke iwu obodo megoro ka o buru iwu.
Oru ndi kansul ahu ebelatala ka ndi inyom si amu nwa site n'out nwanyi n'umu isii rue otu nwanyi umu ise. Africa News (Niuz Afrika). 12
12 Page 13 14
Radio
Vol II No 9 August 1999 [Igbo]

13
CHANGE
Imegbu Umuntakiri Na Epu Ome n'Uganda Otu nkeji na tinkom iri ano na otu. A na eti umu ntakiri Uganda ihe, kuo ha mpo osoro gi osoghi gi, were ha kpuo aru di iche iche mana o dighi ihe
iwu ga eme onye na akpa agwaa. Obu akwukwo akuko Uganda Monito nke July 13 dere ya.
Akwukwo akuko a dere na ufodu umuntakiri na anwunyu anya ma n'ulo ma n'ulo akwukwo. Ufodu bu ndi nne na nna ha na egbu ha, bo ha orusi maka obere iwu umuntakiri na-ada dika izu ohi ma o bu ichotara nna ya
atanu aka ya mgbe ije oru di ya ososo. "Nke na ewukariri ha bu ikefe umuntakiri aka azu were akwukwo ogede kpuchie ha, muo ha oku obunadighi
ndi di naani afo ato." Nso nso a, goomenti Uganda weliri afo ikwanyere umu nwanyi ugwu site n'afo iri na ano
rue afo iri na asato. Ndi ihe a na ewute choro ka goomenti mara ihe ha ga eme maka ikwusi aru ahu.

N'uche akwukwo ahu, "otu n'ime nsogbu so mmegbu umuntakiri bu na e werebeghi ya ka oria ji obodo." Ewepu mbo ndi NGO, goomenti etinyebeghi ego inyocha ma o bu kwadobe ogba ko ga atule nsogbu maka
ikwusi ya." Africa News (Afrika Niuz).

Okwu Di Mkpa Nduku Oru Ebube Tinkom iri ano na ise
N'afo abuo gara aga, anyi kwuru na otu nduku na-eme nke oma emeziela onodu ndu ndi Kamerun ka oburu uwa oma. Ya bu oru ebube ka ebulatara n'ebe a na azu ehi na-Saut Nigeria.

Ugbua, akuwa kwala udi ya n'Amerika. Aha nduku ahu bu Transie nerik. O nwere ike iwelite ego onye oru ugbo n'udi otughi anya; dika nari dola abuo kwa otu eka. E ji kwuazi ya emeputa Etanol e ji aru ogwu.
Environmental News Network (Envairomental Niuz Netwok).
Igbo Elu Nwere Ike Iju N'ala Tinkom iri ise na abuo. Che godi ihe a echee. E be ino n'ura n'abali taata, otu agidigi ihe n'efe n'elu, ha ka nnukwu nkume Platu Stet,
ghara ebe ufe ya n'elu juo n'ala. Uche gi bu na o pughi ime. Mana o nwere ndi uche ha bu na onwere ike ime. Ha bu ndi gbakoro na Mahadum Konwel di n'ltaca, Niu Yok di na U. S. A n'aha ogbako ha kporo Asteroid,
Komet na nke inyo ihu igwe.
Ndi oka mmuta n'ihe ikuku siri na o bu naani otu uzo n'uzo iri bu ihe enyoputara n'efe n'akuku ele uwa. Ha sikwara na otu n'ime ihe ndia nwere ike iju n'ala otu ubochi.
National Geographic News (Nashonal Jiografik Niuz).

Ohia Ghana Tinkom iri abuo na isii Ohia mmiri Ghana ruru nari abuo na iri asato nwere osisi timba otu nari na iri iteghete di iche iche, mana nani iri
ise bu one azugoro n'ahia. Iwu siri na bere isii na nde kubik abuo bu ihe ha na egbu kwa afo.
Otu onye ji kubik abuo aru oru kwa afo mana ndi Nigeria bu nani otu kubik na okara ka otu onye na eji aru
kwa afo. George Ameyibor/ Obasi Ogbonaya. 13
13 Page 14 15
Radio Vol II No 9 August 1999 [Igbo]
14
CHANGE
Kedu Ka Onyupa Na Esi N'ugbo Alagi Ha? Tinkom iri ato na otu Ima onyupa kabon daiogzaid ole si n'ugbo ala gi aputa? Ka anyi mee ka I mara. O buru na inyaaa ugbo ala
Urop Kilomita iri na ato, otu lita manu ka o ga-eri. I gbaa ya mail puku iri na isii, kabon daiogzaid ga esi na ya pua ga eji ugboro ato karia aro ugbo ala gi ahu. Chee ihea e chee.
WWF.
Ndi Gburugburu Ha Churu Oso Ka Ndi Oso Agha Tinkom iri ano na ato. Ndi gbara oso ala okpoo, ide, nsubi ohia a na mmeto ala n'otu aka, tinyere nsogbu si n'ubiam na ibi n'ulo dicha
ka nke okuko ka ndi otu red kros n'akowa na o na-abawanye n'akwukwo ha dere n'afo 1999 ha kporo "Mkpamkpa mberede uwa".

Mgbe nsogbu abuo ndi a biri oma, mkpamkpa ohuru ga-adi egwu ka I ga-enweta. WWF. 14
14 Page 15
Radio
Vol II No 9 August 1999 [Igbo]

15
CHANGE
Akronim
AFFF -Ufufu Akwuios
APL -Iju ogwunigwe ime ala
BBF -Brodas Broda Faundeshon
CBD -Ogbako ihe bi n'uwa di iche iche
EU -Uropian Union
GEF -Ikwado gburugburu mba uwa
IPCC -Mmeko gomenti di iche iche maka mgbanwe ihu Igwe.

NASA -Ihu maka ikuku na ihe na efe na ya
NGO -Ndi oru nwere onwe
OAU -Otu nzuko ala Afrika dum
UN -Ogbako uwa dum
UNDP -Otu mba uwa okwu mmepe di n'aka
UNESCO -Otu mba uwa okwu akwukwo, sayensi na
Omenala di n'aka

USAID -Ajensi Amerika mmepe uwa di n'aka
USIA -Ajensi Amerika n'ahu maka mnweta na
mgbasa Ozi. 15

Page Navigation Panel

1 2 3 4 5 6 7 8 9
10 11 12 13 14 15

 

© 2002 Communicating for Change. All Rights Reserved
Developed by George Mbuagbaw