Go Back
Communicating for Change

Document Body Page Navigation Panel

Pages 1--15


Page 1 2
Radio
Vol II No 8 July 1999 [Igbo]

1
CHANGE
NDINAYA Nkeji Ole Ibe

Mmepe AHUIKE
Usoro mbagide oru ahuike ohuru
n'ime obodo Tinkom Iri Ise na Isii
Enyem aka onwe, nke otu ndi ofesi

na nke goomenti ga e welite onodu
ahu ike n'Afrika.
Ogwu Ohuru Nwere Ike Igbochi
Onwu si N'oria Iba Tinkom Iri Ise na Otu
Nnyocha a na-eme ugbua maka ibelata

ike oria iba ka ogharazie ibu ogbu n'ike
Nkpankpa Oria Mmiwu N'akpa N'Afrika Tinkom Iri Ano Oria mmiwu ka na-anara umu nkakiri

Afrika ruru nari kwuru puku ndu ha.
ERIMERI
Otu na-ahu maka erimeri na iko ugbo na-Ama okwa maka n'erimeri ezughi

oke Nkeji na Tinkom Iri Ise na Asato Oke iku azu na-ememila erimeri n'obodo
n'emepe emepe
United Nations Choro Ka Ebugara Ndi Angola Nri Nkeji Abuo Na Tinkom Iri

Oburu na agbakwughi ndi Angola oso nri
enyem aka, aguru ga ememila nari kwuru
puku ndi ebe ahu.

Spirulina -Alga ogbara uwa gharii Iteghete. Nkeji Abuo na Tinkom Iri Ato na

Ezi na ulo obula kwesiri ima maka
mkpuru osisi a bara uru ihe nile

SCIENCE
Ndi Nnyocha Na-Amu Ka Amuma si Ese Nkeji Abuo na Tinkom Iri Ato na Isii

IBI NDU
Ahuhu Umu Uwa Tinkom Iri Abuo na Asaa. Angola – Obodo na-ata ahuhu

agha afo iri abuo na ise akwusi akwusi.
Ndi Nyom Bangladesh Na Enye
Ngali Ka Ha Na Ndi Nwoke Hara. Nkeji Abuo Na Iri Ano na Isii
Ndi inyom na Bangladesh na-acho

ka ha ga esi nweta ikike di ha mma 1
1 Page 2 3
Radio Vol II No8 July 1999 [Igbo]
2
CHANGE
Nkeji Ole Ibe AKU NA UBA
Otu okwu odi mma umu ntakiri di n'aka (UNICEF) choro ka ndi Afrika Otu Nkeji na Tinkom Iri Ano na

ji ugwo gbaghara ha. Ato Unicef, otu uwa na-ahu maka umu aka
siri na ugwo Afrika ji na-emegide ike
onatarachi umu nwanyi na umu aka.
Uwa Ekerela Maka Mgbaghara Ugwo Tinkom Iri Abuo na Isii Nchikoba maka isi n'iji ugwo puta

Okwu E kwuru make mmepe Tinkom Iri Ato Ato Okpurukpu ihe na-egbochi mmepe
n'Afrika
Komishon aku na uba e guzobere maka Afrika na-akwado ibagide oru mmepe Otu Nkeji na Tinkom Iri na Asato

Ibelata ubara mmadu na
imu nwa ga ewelite mmepe toro ato n'Afrika.

Gburugburu IHU IGWE
Ekpomoku Ihu Igwe: Ka Odi N'India Tinkom Iri Abuo na Asaa Ekpomoku nwere ike imekpa kwa ndi
India ahu ozo n'afo a.
Mgbanwe Ihu Igwe: N'ezie Ka Obu Mkwugha Tinkom Iri Ato na Isii Mgbanwe ihu igwe di ka ogbuola ozu izizi ya

NLEKOTA ONATARACHI
Okwu E kwuru Maka Nlekota Onatarachi Tinkom Iri na Asato Akparamagwa ndi mmadu gbasara onatarachi

Iche Mkpa Mkpa Ga Akpa Tinkom Iri Ato Aru ga-eme n'ebe nrite uwa

OHIA
Ebe Okwu Ikike ilekota Ohia no Ugbua Tinkom Iri na Asaa Ndi Na-ewu Ulo Na Ndi Oru Osisi

Kwudooro Atumatu Ilekota Ohia Tinkom Iri Ise na Ano Otu oru osisi ofesi bu ndi ozo kwudooro
atumatu ilekota ohia.
NNYUTO
Ndi Mmeto Ekweghi Akwusi Tinkom Iri Abuo na Otu Ndi ugbo ala tank mmanu nwere

akparamakpara adighi mma Mba Ano N'afrika E Nwetala Tinkom Iri Ise Na Isii
nkwado ulo oba ego uwadum
maka ibuso onyupa mmanu agha
Obodo ano n'India e nwetala enyem aka ibuso
Onyupa n'otutu owa mmiri ha agha.
2
2 Page 3 4
Radio
Vol II No 8 July 1999 [Igbo]

3
CHANGE
Cote D'Ivoire E gosila Njikere Imerei Oghom Mberede Mmanu Tinkom Iri Ise na Isii
Ka oku gbachara tank mmanu ha n'atughi anya,
Cote D'Ivoire adila njikere maka oghom mberede.

EBE MMIRI
Amalitela Usoro Izoputa Ihe Ebemmiri Tinkom Iri Ise na Iteghete A tuputala ka a ga-esi zoputa ihe ebe mmiri uwa.

Cote D'Ivorie E gboola Nsogbu Ahihia Tinkom Iri Ise na Ise N'epu na Mmiri Agha iri afo abuo maka ahihia
n'epu na mmiri e nweela isi

NDU OHIA
Olee Anumanu Ka Nwe Agburu Tinkom Iri Ato na Isii. Anumanu a Kacha etikota udi ozo nile onu

nwee agburu

IWU NRUAKA
Nkikuta isi ga-egbochi ndi kwe ndi ekweghi maka ihe onatarachi Tinkom Iri Ise na Asaa

Obodo asaa na Sautan Afrika noro nzuko maka
nsogbu metutara gbrugburu nwere ike iputa.

Mpahara Umuntakiri
Ihe mere na agu anaghi ata nkpuru osisi Nkeji abuo na tinkom iri ato Umu obere anumanu chara akwu tumadu
igbochibe ebe ha na-akpa nri n'ime ohia
Kedu ka Ukwurukwuma Si Eri Ihe? Tinkom Iri abuo na abuo Onu ukwurukwuma roro aro mere o ji adiri ha

mma iri nri ufodu
Kedu Osisi Bukarichara N'Uwa? Otu Nkeji na tinkom abuo na ano Choputa osisi nyikariri enyi ndi Afrika

kariri out puku aro
Ubochi Nwa Afo Afrika Otu Nkeji na tinkom asaa Ubochi ncheta nwa afo Afrika na eme ka uwa

cheta na ubiam bu aru na emegide umunkakri

Glozri
Akronim
3
3 Page 4 5
Radio Vol II No8 July 1999 [Igbo]
4
CHANGE
Akuko
Ogwu Ohuru Nwere Ike Igbochi Onwu Oria Iba Tinkom Iri ise na otu Oge n'adighi anya, oria iba o tegoro aka o gbubere mamdu ga ebe. Ugbua, nyocha na-aga n'ihu ugbua a na
Unaited Kingdom bu isi obodo Briten maka iruputa ogwu ga ebelata ike oria iba ka o ghara ibukwa ogbu n'ike.

N'agbayeghi na nnyocha a agamibeghi ime, e nwere ngosi na o ga abu ogwu ntutu umu ntakiri.
Iba na egbu nde mmadu ato tumadu umuntakiri Afrika Nnyocha a gbadoro ukwu na-ekwu na uzo kacha mma igbochibe ya bu oria bu ime ka umu ntakiri ghara ibute ya. Ya bu na ogwu ntutu ahu abughi maka igbochi oria.
Kama, o ga eme ka oria ahu ghara igbu ndi butere ya. London Press Service

Cote D'Ivoire Egboola Nsogbu Ahihia Na-Epu na Mmiri Tinkom Iri Ise na Ise
Cote D'Ivoire e meriela agha afo iri abuo ha na ebuso ahihia na-epu n'ime mmiri. Ya bu ahihia na-abawanye n'ike n'ike a gabigala ebe azu bicha ma na ebusokwa ihe ndi ozo bicha na mmiri agha tinyere oru mmiri ndi
obodo ahu na-arucha o napuru ha – Ahihia ahu nke bekee kporo haisint, Salad na fens.
Obu usoro ngbochi abagidere n'afo 1997 nyere ndi Cote D'Ivoire mmeri ahu. N'oru otu abuo jikotara aka onu wunyere ahuhu n'ebe azu bicha na mmiri ahu. Ya bu umu ahuhu ekweghi akpo aha ha jidere ahihia mmiri
ahu tapu. Ndi ahu jikoro aka onu were ruo ya bu oru bu ndi oru mmepe Unaited Neshons, bekee kporo
Unaited Neshons Development Program na ndi ihe ndu ime ohia na amasi nyere ha ego bu Wold Waid Fond maka Necho (WWF) na bekee.

Ha na-azu umu ahuhu ahu ebe uzo ano di iche iche n'obodo ahu, nke ga eme ka ha si otu esi chewe ha iru na atachapu ahihia ahu.
Afrika News On Line.
Ndi Na Ewu Ulo Na Ndi Oru Osisi Kwudoro Atuma Ilekota Ohia -Iri Ise na Ano

Otu iwu ulo na oru osisi mba ofesi kporo onwe ha Intanashonal Fedreshon Iwu Ulo na oru osisi na bekee, (IFBWN) na nkenke a kwudorola atumatu ilekota ohia ka o baara uwa uru.

Nkwudo a si na nkwekorita ha na ndi ji ego akwado ndu ihe nile di n'ohia bu Wold Waid Fond maka Necho na bekee WWF na nkenke kwekoritara n'onwa Juun maka iwelite onodu ngbochi na nzulite ihe chinyere anyi
n'uwa na uzo iruba ihe oriri esi na ya emeputa ama.
Ode Akwukwo ndi IFBWW, Ulf Asp Kwuru si na" ndi na-aru oru ebe ahu na ndi otu oru ndi ozo nwechara mkpa ebe ahu na egboro ha, o buru na ha memilaa ohia ahu, ha achuo onwe ha n'oru.

Ndi IFBWW nwere ndi oru kariri nde iri n'obodo ruru otu nari na iri abuo na otu. Ebumunuche ndi WWF bu ihu na ebe ohia ruru nari nde hekta abuo ebe eji ama atu tupu afo 2005.
WWF. 4
4 Page 5 6
Radio
Vol II No 8 July 1999 [Igbo]

5
CHANGE
Usoro Mbagide Oru Ahu Ike Ohuru N'ime Obodo Tinkom Iri ise na Isii N'ime obodo, enye m aka ego goomenti na Ministri ahu ike na enye maka inwe ahu ike di ka obu ya kacha
mma n'Afrika tumadu na Ghana, ebe usoro a bu nke e ji ama atu.
N'afo 1993, ndi ime obodo Navrongo di n'odida anyanwu ugwu Ghana mere oru ruo ka m lelee maka ahu ike
na okwu gbasara ezi na ulo ha kporo komuniti helt na famili projekt (CHFP) na bekee.

Ebumnuche ha bu ibagide nsogbu na egbochibe inwe ahu ike n'ime obodo Ghana. Nsogbu ndia bu, oke onu, uzo ite aka, amaghi aru, adighi ire n'oru, na agwa ogbasara m.

Ndi okacha mara siri na ndi CHFP rutara oru a. Ya mere ndi mba ozo ji bia n'enyoro ka ha siri ruo ya. Ya bu oru ndu Navrongo na-egboro ndi ruru otu nari puku na iri ato na iteghete mkpa ahu ike.
O bu ndi Amerika na-ahu maka oru mmepe kporo onwe ha U. S. Ajensi maka mmepe USAID, Ndi Rokifela Faundeshon na ndi Ministri Ahuike na Kansul onuogu ji ego kwado oru ahu.
Newslink Africa
Ntikuta isi Ga Egbochi Ndi Kwe Na Ndi Ekweghi Maka Ihe Onatarachi Tinkom Iri Ise na Asaa

Ntikuta isi e mere n'onwa juun gara aga na Mozambikwe di na Sautan Afrika e meelaka a mara ihe na adochigha agamnihu ihe anatara chi azu. Ndi oru mnwere onwe ndi Finnish na Kuti guzobere ya.

N'okwu ya mgbe a na-amalite nzuko ahu, Minista ndi Mozambikwe okwu gburugburu di n'aka doro aka na nti na aghaghi inwe nghotahie ka e si ewere ihe ebe onatarachi ahu na Sautan Afrika.
Okwuru si, a ga atu aro ka ihe esi ebe ahu eweta tinyere ilekota ebe ahu anya baara ndi nile ebe ahu meturu uru"
Otutu oshimili gafechara oke ala n'Afrika. Ufodi n'ime ha bu ndi arugoro dam na mgbago ya.
Ntikuta isi ahu ga egbochi nghotahie ebe ahu obu ndi Eduard Mondlane Faundeshon nyere aka kwado ya. Ndi gara ya bu nzukobu ndi Angola, Botswana, Kenya, Malawi, Namibia, Zambia, Zimbabwe na Finland.
PANA
Amalitela Usoro Ga Azoputa Ihe Ebe Mmiri Tinkom Iri Ise na Iteghete Ndi ji ego akwudo oru nlekota ihe ohia uwa dum bu Wold Waid Fund maka Necho, (WWF) na nkenke a
malitela usoro a ga – eji lekota ihe ebe mmiri uwa dum. O bu n'ogbako nke asaa ndi Ramsar e mere na Kosta Rika, e be obodo jere nzuko ahu kwetara ibagide usoro ahu ka a a no kapia ya onu ma kpoo ya usoro mmiri
di ndu.
Ya bu usoro ga akwusi uko mmiri n'uwa, ilekota ihe nile bi n'oshimili, lek, spring, oto na ebe mmiri ndi ozo anya.

"Obu ihe anyi ji enye aka ilekota on atarachi anyi anya ka otoo atoo" dika onye Dairekto Jeneral WWF bu Claude Martin siri kwuo obu n'ogbako a gbakoro site n'ubochi di n'iri rue iri na asato ka onwa ise di n'iri na 5
5 Page 6 7
Radio Vol II No8 July 1999 [Igbo]
6
CHANGE
ato ka ha kwuputara nke a. Ha kwukwara na ha bu n'obi okwu ahu gbasara enweghi ego ji ha n'olu n'ogbako Ramsar.
WWF.
Mgbanwe Ihu Igwe: N'ezie Ka Obu Nkwugha Tinkom Iri Ato na Isii
A siri na obu mgbanwe ihu igwe butere ofufu agburu awo iri abuo na Kosta Rika. Obu n'akwukwo Sayensi kowara ya ka "ihe omimi" ka e dere nkea.

A siri na o bu site n'udi nkocha puru iche ohia Monte Verde kochara butere ofufu ahu tinyere nke El Nino n'afo gara aga.
Otu onye oru ndi okwu gbasara ngabiga ihe bi na Mmiri n'Amerika bu Michael Lannoo kowara na o bu mgbanwe ihu igwe butere ofufu umu anu ahu. Aha oru gwu agbasaa ahu ha guzobere bu Deklainin Amfibian
Populeshon na bekee. Ya bu oru ilekota ka ihe mmiri si anwu. WWF.

Mba ano n'Afrika e nwetala nkwado ulo oba ego uwa dum maka ibuso onyupa mmanu agha Tinkom Iri Ise na Isii
Mba Afrika no n'oshimiri India' maka nsogbu onyupa owa mmiri ha'e nwetala enyem aka ndi ulo oba ego uwa dum. Ndi ulo ego a kwetara ibagide oru ga eri nde dola ise maka ikwusi iwufu kemikal haidro kabon.

Okwu a putara ka e jechara ogbako n'obodo Quatre – Bornes di na Mauritania ka onwa Juun di n'ubochi iri abuo na otu nke ndi Mauritus, Comoros, Madagascar na Seychelles jere.
Ka ha siri deputa, nke a bu mbu na mbu obu ndi Global Envaironmental Fond GEF, ngalaba ulo oba ego uwa na-akwado oru gburugburu buuru udi oru a n'isi.
Ya bu ogbako tukwara aro gbasara ka a ga-esi ti ndi onyupa mmanu nyuru anya aka n'obi. Otu uzo n'uzo ato n'ime nde ite mmanu iri isii ka e si oshimiri India e bupu.
PANA.

Nkomi
Cote D'Ivoire E Gosila Njikere Imeri Oghom Otu Nkeji Tinkom Iri Mberede Mmanu Abuo na Iteghete
Nari kwuru nari ndi Aivoria, tinyere ndi nta akuko so kirie ihe ngosi ziri njikere obodo ahu igbochi onyupa oshimili n'isi obodo Abijan be ha ka ubochi di asaa n'onwa Jun.

Ya bu ngosi si n'ihe mberede oku gbara ebe ugbo ala mmanu ha nocha n'isi obodo ha bu iji gbaa obodo ahu ume were gwa ha atula uche na udi ihe ahu agaghi emekwa ozo.
Ndi huru maka ihe ngosi ahu bu ndi na ebuso onyupa agha bu maka ibuso puku ton iri ato onyupa mmanu wunyere na leguun ha. Ndi oru Poluma bu ndi okaibe n'ihe ghasara mmeto oshimili so gosi njikere ha.
Ha ji ndi otu. Oru mgbochi oku ise were gosi nkwado ha igbochi oghom mberede gburugburu di iche iche. Isi 6
6 Page 7 8
Radio
Vol II No 8 July 1999 [Igbo]

7
CHANGE
okwu oru ha bu ihu na onweghi ndi njem izu ike na nleghari anya na eje egwu mmiri n'oshimili ma o bu ulo oru faktri, igbochi oku ogbugba, igbochi onyupa mmanu na izapu ya ebe o metogoro, iburu mmanu ebe ugbo n'aba

na inyere ndi mberede ribidoro aka.
Onu ogu ndi mere ihe ahu di, ndi oru mgbochi oku iri ato na asaa, lita ufufu nari puku isii, ugbo ala eji emenyu
oku ato. Africa News On Line

Mkpokoba Ndi Oru Maka Aku Na Uba Choro
Inye Aka Mepee Afrika Otu Nkeji na Iri na Iteghete
Ndi otu onu ekpokobara na ahu maka odi mma aku na uba kporo onwe ha Ekonomik Komishon ndi Afrika

(ECA) eburula mmepe toro ato na imelite onodu aku na uba Afrika n'isi site n'ibusa ozi ka ebelata ubara mmadu.

Ndi otu ahu ama maka ime ka nri zuo oha onu, na mmepe toro ato kporo onwe ha Fuud sekuriti na sostenebul development (FSSDD) na ndi kwesiri iha ka ala na emeputa nri ha ga-eri ha".
A ga-esi obodo oru a nwegoro isi were gbasa a ya n'Afrika niile. Ebumuche ha bu iwedata ubara mmadu ihe dika pasenti abuo ko owere nwe isi ime ka ezi na ulo obula nwee naani umu abuo n'abughi bido umu ise ruo
umu asaa ha nwe chara ugbua.
Akwukwo ndi ECA na – akowa na ubara mmadu aridawala n'otutu obodo n'Afrika tinyere na ha ebiwela ogologo ndu n'ihi na onodu ebim ndu ha enwe la ihu ochi.

Ha bu ndi ECA ga agbasi mbo ike n'igbasa ozi a tinyere inye aka ebe okwesiri maka iguzobe onodu mmepe toro ato n'Afrika.
Economic Commission of Africa
Otu Na Ahu Maka Erimeri Na Iko Ugbo Na Otu Nkeji Na Tinkom Ama Okwa Maka N'erimeri Ezughi Oke Iri Ise na Asato
Oria si n'erighi ezi nri nwere ike ikpo chapu ekee uwa isii site n'aka oru ndi ji ugbo mmiri trola aku azu n'oshimili mba uwa n'ihi na azu ha na akuru kwa ubochi ka de ndi a na-amuta ohuru.

Ihe kariri otu nari nde ton azu na iri ka ha na akuru kwa afo. Ma ihe okwesiri ibu bu site na ton iri asato na abuo ruo otu nari nde ton.
Obu obodo na emepe emepe ka okwua ka njo n'ihi na azu bu ihe nari nde iteghete na iri ise ji eme erimeri.
Ka o si na di ozi ndi otu nri na akom ugbo nke mba uwa kporo onwe ha fuud na agrik oganizeshon (FAO) na bekee na egosi na otutu obodo ndi n' emepe emepe sozi azu ahia azu na ihe oriri di iche iche esi n'azu meputa.

Ndi FAO kwuru si, "ka ndi na ebupu ya ofesi na-akpa ego ala bekee, ka isi ime obodo bufee ya ebe ahu na anagha otutu ndi mmadu tumadu umu ntakiri ihe oriri".
Azu na-esi n'oshen abia, naani ntakiri na-esi n'oshimiri na ebe mmiri ndi ozo ya mere okwukwo ndi na-aku azu na-ekwozi n'oshen. 7
7 Page 8 9
Ndi FAO gosikwara na ihe ruru mmadu nde iri ato bu ndi ji iku azu mere aka oru tinyere na otutu obodo na-emepe emepe bu ihe ha tukwasara obi ha si e nweta protin.
Ndi odi mma gbururgburu na-amasi na akpoku goomenti ka ha belata utu isi ndi faktri azu na akwu ya na imachi iku azu mpu.
FAO.
Ndi Unaited Neshons Choro ka Ebugara Ndi Angola Nri Nkeji abuo na Tinkom Iri.

Otu mba uwa Unaited Neshons a kpokuola ndi otu di iche iche n'uwa dum ka ha soro gbagara ndi Angola oso e nyem aka site n'ibunye ha mkpuru nri di otu nari puku ton na iri asato maka mgbochi oria erijughi afo
n'obodo ahu agha tisagoro.
Akwukwo ndi UN development na Juun gosiri na nari kwuru puku ndi Angola nwere ike ida n'oria erighi ezi
nri, enweghi ezi ahu ike na iru inyi. Ndi otu ha na ahu maka nri na iko ugbo, FAO na ndi ogbo ha okwu nri di n'aka bu WFP, ya bu Wold Fund program na bekee kwekoritara na o bu ezie ma kwuokwa na mkpuru nri

ahu a na ebunye ha ga na aga n'ihu ruo onwa iri di n'ihu. Ekwere ha nkwa ton nari puku iri ise na isii ofodu otu nari puku ton na iri abuo na ano.

Ndi ihe kacha eribido di nde mmadu ato. Nde mmadu abuo bu ndi gbara oso agha otu nde foro afo bukwazi ndi agha napuru ugbo ha.
Akwukwo ha kwukwara si "Agha ahu metutara ime obodo ha nile ma ebe okacha metu bu ndi ime obodo amaara nkeoma maka iko ogbadu".
Ndi FAO na ndi WFP okwu ibuga nri n'obodo ahu di n'aka na – ado aka na nti na nri ga – ako ihe di egwu n'onwa di n'ihu.
Oburi site n'afo 1975 ka nsogbu ndi Angola malitere mgbe ndi kporo onwe ha soshialist muvmenti maka itopu
Angola n'agbu MPLA guzobere goomenti nwere onwe nke mbu n'obodo ahu.

Ndi otu siri na ha choro nwere onwe kpam kpam nke Angola bu UNITA ndi obu Saut Afrika na otutu goomenti ndi ofesi donyere ukwu na-alu ya bu agha.

Ha binyere aka n'akwukwo ka udo di n'etiti ha n'afo 1994. Ma ko o si di, onwebeghi ndi choro ikwanyere nkwekorita ahu ugwu.
Ya bu agha emeela ka ala iko ugbo koo uko ma gbochikwa ka obodo ahu si ako ugbo, dika akwukwo ahu gara n'ihu kwuo.
IPS. 8
8 Page 9 10
Nkomu Puru Iche
Okwu E kwuru Maka Ihe Onatarachi Tinkom Iri na Asato "Nwoke ogbara ohuru, nke onodu uwa ya megoro ka ya na nkpotu na ugbo ala na-esi isi agaghi enwe olile
anya, ma o buru na o jikereghi nke oma na site n'ozuzu ibu naani o gbara iche ebe obula ohuru onwe ya". Max Nicholson, Founder Trustee WWF – UK.

Ndi nnyocha na amu ka amuma si ese Nkeji Abuo na Tinkom Iri Ato na Isii N'afo 1959 na afo 1994, bere ihe na mmadu puku ano nwunyuru anya tinyere puku mmadu iri amuma meruru
ahu. Amuma bu oke oku n'ese n'elu ihu igwe otu ntabi anya oge udu mmiri. Ihe ibu njo a na-emebi ihe ruru
nde dola iri ato na ise kwa afo.

Otutu mmadu a choola imuta ka o si ese ma were oku ya mee ihe bara uru. N'uzo a ka mmadu si muta maka oku latrik.

Nso nso a , ndi sayensi jere nzuko na Guntasvil di n'Alabama igosi ka ha si mutadebe ka amuma si ese n'udi ighota usoro ya, ebe o na-ese, mgbe o ji ese na ihe kpatara o ji ese. O bu ndi obodo Amerika na aru oru ihe
n'eme n'elu ihu igwe kporo onwe ha Nashonal Eronotic na spes administreshon NASA huru maka nzuko ahu. Ihe na ji mere isi okwu bu ihe ha ji akurungwa ha ji enyo ka amuma si egbu were nweta.

Hugh Christian si Global haidroloji na ebe omumu ihu igwe na Honstvil Alabama siri, "O dika amuma o na eso mgbanwe ihu igwe na agbanwe kwa afo".
Ha siri na amuma na esekari n'elu igwe kpudoro ala karia nke kpudoro oshimiri. N'ezie nke na-ese n'elu ala ruru pasenti iri iteghete na asato. O na esekari n'oge ehihie. O bughi ka osi se n'afo a ko o ga-esei se afo ozo.
Enwetachaghi ya ebe tropik n'ihi na ala adighi ebe ahu nke ukwu. Ha nozi ugbu a atughari uche imata ka mgbanwe ihu igwe si ebute ise amuma. E nwere olile anya na o bu site n'imata ka amuma si ese ka a ga-esi
muta ka ihu igwe si akpa agwa. Environmental News NetWork

Okwu E kwuru Maka Mmepe Tinkom Iri Ato Na Ato. N'isi n'amaghi elekwa gburugburu ruo na imata ka okwesiri isi elekota ya, mbo mmadu nile na usoro mmepe
ekwekotaghi etu chukwu siri kee uwa a gaghi ato ato mgbe di anya. Otutu obodo n'Afrika no na nsogbu
oghom si na gburugburu na emekpa onodu aku na uba na mmekorita mmadu na ibe ya ahu. Nke kasi mkpa bu isubi ohia, imebi ala, inyuto owa mmiri, amaghi uru ala na ihe mmiri na imefu ihe n'ile uwa natara chi ha.

Economic community of Africa

Mpahara Umu Ntakiri
Ubochi Nwafo Afrika Otu Nkeji Na Tinkom Asaa Ubochi nwafo Afrika nke e chetara n'onwa gara aga mere ka e cheta mmeru aru ubiam na-emeru ndi inyom na
umuntakiri Afrika. Ya bu Jun 16 ka e weputara n'afo 1976 ka egbuchara otutu umutakiri na-aga akwukwo n'ochichi nchigbu Saut Afrika. Umuntakiri ahu biliri ime ngaghari iwe maka nchigbu goomenti na achigbu
Soweto-ebe kachasi ebe ndi ozo ndi ojii bi na udi usoro ochichi ha jidere naani ndi Afrika na-echi onu n'ala. 9
9 Page 10 11
Radio Vol II No8 July 1999 [Igbo]
10
CHANGE
Mgbe ochichi nchigbu a mara afo n'ala aro ano gara aga, ndi Afrika na-aga n'ihu na echeta uchochi ahu iji were na-echetara goomenti nkwa ha kwere umuntakiri, isopuru ike Chinyere ha na inye ha oke ha maka odi mma
ha.
N'afo a , ihe ha ji echeta ya bu, "Iwe Okonobi a na eweso umuntakiri na oria mmiwu chebiri ya ihu". O na-eme ka amata ka ubiam si emekpa ndi inyom na umuntakiri ahu maka ajo atumatu idozi onodu aku na uba ndi
Afirka ji ugwo tinyere ha. UNICEF/ IPS.

Ihe Mere Na Agu Anaghi Ata Mkpuru Osisi Nkeji Abuo na Tinkom iri Ato
Otu ubochi, Bwawa, nke a na-akpokwa nkita ohia choputara mkpuru osisi udara na-aso uso. Ka o no ala ebe ahu ata mkpuru osisi ahu, onuru ude agu ebe di anya. Uche ya gwara ya, "Agu ana-ebe ka nke aguru ji". E

bumuobi na ogaghi esi uzo a bia choputa kpuru osisi oma m nke a".
Echiche mgbakasi ahu biara ya n'ihi na onye obula ma na agu bu eze anumanu, nwere okpori afo, nwere ike
inara onye ozo erimeri ya.

Ya bu agu biara nso ma tupu orute Bwawa onye aghugho o burula uzo tuputa aro o ga eji gbochi agu ahu ira udara ya. Ka agu rutere' Bwawa bidoro n'ara udara ngwa ngwa ka onye aguru na-egbu maka meekwa ka
agu ahu hu ya ka osi ara udara ahu ka o bu soso naani ya ka o puuru.
N'otu ntabi anyi Bwawa juru onwe ya n'ala na-atu akpiri onwu, na asu ude tupu oloo ndu n'afo. Agu chere na udara ahuhu na egbu-egbu, were nwayoo gafeere onwe ya. Ka o gamiri Bwawa biliri ga weta okpukpu ozu
otu jakal ochetara ebe o di, bia lite ya n'ukwu udara ahu o mere na ya anwuola, laara uwa ya.
Ka izu ole gachara, agu ahu gafetara ebe ahu, hu ka udara chajuru n'elu. Ka oruru n'ukwu ya ohuru ozu nkita ohia ahu ebe a bosasiri ya were cheta ihe mere ubochi ahu mgbe Bwawa na ara mkpuru udara n'ukwu udara
ahu. O n'uru iyi na ya agaghi emetukwu mkpuru osisi ahu aka ozo.
Site ubochi ahu, agu arabeghi udara ma o bu mkpuru osisi ndi ozo. Nke a mere ka nkita ohia na ndi obere
anumanu ndi ozo nwee anuri n'ihi na ha ga na-arazi udara otu omasiri ha na-abughi ka ha na agu afo anaghi eju eju kewe ya.

When Hippo Was Hairy
Kedu Ka Ukwulukwuma Si Eri Ihe? Tinkom iri abuo na abuo Ukwulukwuma n'ami umi okooko. Nke a bu nri ha. Ya bu onu ogologo ha biara n'okpuru isi ha kekoo.
Igbado anya kirie ukwulukwuma nke oma I ga ahu ya. Ukwulukwuma bu ahuhu mara mma mwere nku ocha di iche iche mara mma.
Chongololo
Kedu Osisi Bukarichara N'uwa? Otu Nkeji na Tinkom Iri abuo na ano
Osisi bukarichara n'uwa bukwa ihe, kachasi ihe nile n'ekume gbaa agbaa n'uwa dum. O bu agidigi osisi
sekwuoiya a na-akpokwa Jeneral Shaman na bekee. O na-eto na Not Amerika n'ime USA na Kanada. 10
10 Page 11 12
Radio
Vol II No 8 July 1999 [Igbo]

11
CHANGE
Odi mita iri asato na ato, anaka ya ruru mita iri abuo na ano n'ogologo – ka I ga esi mata ka osisi ha n'ibu bu ikpota umu akwukwo iri isii si ha gbaa gburu gburu, ma jikoo aka ha onu. Otu gbururugburu mmadu iri isii ahu
ha, ka ibu osisi ahu ha. I ga ekweta?
I choo imata ka uwa di n'elu ya, o di ka irigoro ulo elu nkeji iri ato na otu arudewere ya nso Aro ya n'ada ton puku isii na otu nari dika imakota aro enyi Afrika gbara agba otu puku ma o bu umu akwukwo ruru nari puku
na otu.
E gbutuo Jeneral Shaman, a ga-eji ya ruputa mpaoku ga-eru bilion ise. Otu odila, I ga ekweta na obughi
Jeneal Shaman tokarichara n'uwa? O bughi ya. O nwere osisi sekwuoiya ozo di n'Amerika tokariri ya bu Jeneral Shaman. Oka otu nari mita na iri n'ogologo.

Chongololo.

Ihe Gbasara Umu Nwanyi
Otu Okwu Odi Mma Umuntakiri Di N'Aka (UNICEF) Choro Ka Ndi Otu Nkeji na Tinkom Iri
Afrika Ji Ugwo Gbaghara Ha Ano na Ato
Oriaku Parole Bellamy, onye isi ndi Unaited Neshon ji ego akwado oru umuntakiri, a kpoola obodo asato bu
akwaa akwuru na mmepe n'uwa (G8) ka ha gbaghara ndi Afrika ugwo e ji ha. O siri na ya bu ugwo na-anyigbu Afrika na emekpa ndi inyom na umuntakiri ha ahu.

Dika osi kwu ubochi a na-echeta ubochi nwa afo Afrika, "Ya bu ugwo na-aruzi afo, o nwere ka o di, na ugbua a na-aba ukwu afo ohuru na nde kwuru nde ndi mmadu ga-ato n'agbu ugwo ha ji".
A bia na sob Sahara, haji ndi Briten, Kanada, Frans, Jamani, Itali, Roshia na USA ugwo kariri nari bilion abuo.
Ogbako ha guzobere n'afo 1996 maka inyere obodo iri ano na otu karisiri ibe ya n'ubiam n'uwa dum tinyere Naijiria bu Intanashional Hevili indebted poo kontri (HIP) na bekee dika Bellany siri kwu.

O ji ndi Afirika n'akpiri. Onwu umuntakiri ji uzo ato karia ebe niile n'uwa. Ego e ji ario ka ebugharia ikwu ugwo eji ji uzo isii kari ego a na-eweputa maka izu umuntakiri nari nde ato n'akwukwo. Otu nwatakiri n'ime
ato ebughi ntutu agbara ya maka mgbochi oria, okara onu ogu ha dum amaghi aka nri ha na aka ekpe. Otu n'ime umuntakiri isii na aru oru n'uwa bu onye Afrika. O sikwara, "O nweghi obodo ga enweta mmeri mmepe
na oburu na otutu ndi be ha nanwu n'agbu ubiam ji nari nde kuuru nde mmadu n'uwa taata. IPS.

Spirulina: Alga Gbara Uwa Gharii Tinkom Abuo na Iri Ato na Ano.
N'ime oshimiri, odo mmiri, lek dika ebe onyupa nyusagoro ka na ebibi kari. Mana, n'akuku uwa dum, otu n'ime alga bu spirulina n'eto n'azu ulo gi bu ihe nzoputa ndi nri atughi onu..

E nwere ike isi ya, taa ya ka anu, ma o bu chekporo ya n'anwu na – efenye ya n'ofe, awai ma o bu ihe onunu. Akwoo ya akwoo ona-esi ka azu amiri ami. E tinye ya na nri, o naghi esi kwa isi. O na-agbanwe kwa ocha
nri ko o na-achazi akwukwo ndu, akwukwo ndu. 11
11 Page 12 13
Radio Vol II No8 July 1999 [Igbo]
12
CHANGE
Spirulina bu alga na-enye protin a na-eri n'uwa dum. Ndi Intamidiet Teknoloji dere akwukwo ohuru ha siri na ha kwetara na o na-enye protin, onwe amino asid, vitamin, Ayon na vitamin A, B12, na E.

E ji ya agwo oria akpukpo ahu, oria n'efe efe, anemia, oria obi na oria akwara. N'India na Afrika spirulina di ire na nri umuntakiri. E nwekwara ya na Demokratic Repoblik Kongo, Bene Ripoblik, Bokina Faso na Sentral
Afrikan Ripoblik.
O teelari mgbe e nyoputere na Spirulina di mma oriri n'Afrika, Amerika na Eshia. N'agbanyeghi na ndi Sayensi matara maka ya n'afo 1939, ndi Chad, India, China, Japan na Mexico enwelari ya.

E nwere ike iko Spirulina n'obere odo nnu ga-adi sukwuia nuta iri na mbasa na senti-mita iri abuo n'omimi. O nwere usoro di mfe maka lekota odo ahu dika izu ya nri, ihu na onwere temprecho kwesiri ekwesi, ichupu
ahuhu naya na ihu na mmiri anaghi aba na ya beelu naaani anwu o choro.
I choo imata maka alga a nke oma deere Edito Chenj Radio, P. O. Box 56283 Falomo, Ikoyi, Lagos, Nigeria. Immediate Technology

Ndi Inyom Bangladesh Na Enye Ngali Ka Nkeji Abuo na tinkom ha Na Umu Nwoke Hara Iri Ano na Isii
Ndi inyom Bangladesh na esi onwu ka goomenti obodo ha mee iwu ha gbasara ihe ruru onye ka o di ka nke Naijira. Goomenti ha jikwanu nwayoo na ege ha nti n'ihi na ha achoghi imejo ubara ndi, uka alakuba na ndi
obere ndi n'efe Hindu.
Ndi inyom choro ka onu na eru ha n'okwu o tu o si eru umu nwoke, otu usoro ga-eme ka umunwayi n'enwe aku na uba nke uwa, ilu di, alukwaghim na onye ga akporo nwa na agbasaa.

Bangladesh ka n'eso iwu uka nyere nwada nani okara ihe n'ihe nile okpara na-erita. Mgbe ufodu, okara ahu anaghi eru na aka.
Mana, otu onye ikpe, Salma Khan bu onye isi oche ndi otu choro ibibi uzo obula e si emegbu ndi inyom kporo onwe ha Unaited Neshons Konvenshon maka ibibi etu esi emegbu Umunwnayi CEDAW na bekee kwenyere
na iwepu ya bu okwu n'ulo ikpe ga enye ha mmeri. Oji Naijiria, Ijipt, na Tunisia ebe iwu ahu nyegoro ndi inyom ihe na choro were ma atu.

Ha na akowa na mmegbu a na-emegbu ndi inyom na Bangladesh mwere olu uka, ebe osi ruo oha na eze ahu. N'ima atu ha siri na a muo nwoke, ndi Mullah na agozi ha nke oma ma o buru nwanyi, uju ka a na-eru. O tua
ka ahuhu uwa nwa nwanyi ahu si ebido.
Nnyocha ha mere na-egozi na otu nwanyi oru ugbo n'eri okara ugwo nwoke oru ugbo na eri. Na ndi inyom na-aru oru awa iri abuo na otu karia ndi nwoke kwa izu uka, dika ndi nnyocha ulo akwukwo Bangladesh maka
mmepe BIDS mere.
Ndi Unaited Neshons ji ego akwado oru di iche iche ma ka o dimma umuntakiri choputakwara na ndi nwoke a nakwaghi agu akwukwo bu nani nkeji iri na abuo ka ha na-etinye n'oru ije ozi n'ulo mana umunwayi ogbo na
jukwara akwukwo na etinye awa ise kwa uchochi. 12
12 Page 13 14
Radio
Vol II No 8 July 1999 [Igbo]

13
CHANGE
N'onwa gara aga minista iwu obodo di n'aka bu Abdul Martin Khasru kwetara na goomenti be ha kwenyere n'ihe niile ndi inyom ha choro.

O siri, "Mana odighi mfe, goomenti egbe bere obula ime ihe ga emejo okwukwe ndi uka. Mazi Khasru siri na
mbu na mbu, ndi mmadu kwesiri idi njikere inabata mgbanwe tupu atuo aro ga-ebute mgbanwe. IPS.

Olee Anumanu Ka Nwe Agburu Tinkom iri Ato na Isii I mara na enwere udi ahuhu di iche iche kariri otu nde n'uwa? Onu ogu a kariri etikota agburu anumanu ndi ozo
onu. Ahuhu ufodu na-eme ihe di egwu. N'ima atu, ijiji nwere ike iwuli elu nari abuo karia uto ahu ya. Anwunta
nwere ike inu obara ya na ahu ya ha na aro otu oge. A na-ekwu na onwere ijiji di na Kalifornia, Amerika na – ebi n'ime mmanu petrool

Chongololo
Mkpamkpa Oria Nmiwu Na Akpa N'Afrika Tinkom Iri Ano Ihe ruru pasenti iri asato no n'akwa oria ulo ogwu n'Afrika bu ndi oria mmiwu ji aka. Obu ndi otu okwu odi
mma umuntakiri di n'aka Unaited Neshons UNICEF dere nke a n'akwukwo ha.
N'owuwa anyanwu Afrika ka oriaa kacha njo. Na Kenya onarala umu ntakiri nari puku isii nne ha na nna ha ebe nari puku abuo na iri ano nwugoro piii. A na-ekwu na onwu si n'oria a ga-egbu ndi bugoro ebu ruru nari
puku abuo n'ihu UNICEF/ IPS.

Ebe Okwu Ikike Ilekota Ohia No Ugbua Tinkom Iri na Asaa.
Ihe kariri ohia di hekta nde iri na isii ka ndi na-azu ohia kporo onwe ha Forest Stiwodship Kausul na bekee nyere ikike ka a na-elekota anya n'udi o ga esi baara oha na eze elele ma di kwa gburugbru mma dika etu o ga

esi nyere mmetuta mmadu na ibe ya aka. WWF.

Ekpomoku Ihu Igwe: Ka O di N'India Tinkom Iri Abuo na Asaa.
N'afo gara aga, ihe kariri madu otu puku na nari ato ndi nwunyuru anya n'ihi oke ekpomoku na –anyu India ikpakwu ugbua-Ndi

oka mmuta na-enyo ihu igwe siri na o nwere ike idikwa otu a n'afo a n'hi na ikuku achawakwala oku.
Ndi oka mmuta siri na ihe ndia na egosi ekpomoku ga adagide uwa dum mana goomenti India weere okwu a ka ihe egwuri egwu.
Down to Earth
Ahuhu Umu Uwa Tinkom Iri Abuo Na Asaa Angola di na Sautan Afrika so n'obodo dakaridara mba n'iwelite onodu odimma ndi be ha. Uzo ato n'ime onu

ogu obodo ha di nde iteghete bu ndi agha iri afo abuo na ise napuru ebe obibi ha. Ihe kariri okara n'onu ogu ha amaghi aka oru ozo abughi ilu agha.
IPS. 13
13 Page 14 15
Radio Vol II No8 July 1999 [Igbo]
14
CHANGE
Ndi Onyupa Ekweghi Awusi Tinkom Iri abuo na Isii Ndi ugbo ala na-eburu mmanu n'oshimili Mediterenian mutara agwa isa ime ugbo ha na mmiri. Nnyocha na-egosi

na ha na-awunye mmanu Krud ruru ton nari puku isii na nari puku asaa na mmiri mediterenia didewere
Atlantik odida anyanwu Afrika kwa afo. WWF.

Uwa Ekerela Maka Mgbahara Ugwo Tinkom Iri abuo na isii Kemgbe afo 1996, otu di iche iche e jikoola onu maka igbaghara ha ugwo ha ji tupu afo 2000. Ndi goomenti,
otu uka, ndi oru nwere onwe, otu aka oru di idche iche na ndi oke ozu di iche iche so na Jubili 2000 a.
Ndi Afrika so na ya bu Nelson Mandela, Achbishop Desmond Tutu, Prezident Jerry Rawlings nke Ghana na nwada Kenya odimma gburugburu na – amasi bu Wangari Maathai.
IPS.
Iche Mkpamkpa Ga-Akpa Tinkom iri Ato
Ihe kariri ton mmanu Krud nari nde ise, e bu aga Yurop, Eshia na Not Amerika ka e si na ala Afrika non'India oshen e bupu. Mbupu a gosiri na ugbo ala tanka mmanu na ebupu mmanu ugboro puku ise kwa afo na mmiri

didewere Comoros na Madagaska site n'Ailand Aldabra ebe uwa weputagoro ha ga akpacha-puru anya. PANA 14
14 Page 15
Radio
Vol II No 8 July 1999 [Igbo]

15
CHANGE
Glossary
SEQUOIA -Sekwuoiya -Oke osisi ndi California nke na-acha mme-mme
Acronyms
AID -Oria Mmiwu
BIDS -Ulo Akwukwo Bangladesh na-amu ihe mmepe obodo
CEDAW -Ogbako ikwusi nho n'emegide ndi inyom
CHFP -Mbagide oru ahuike na usoro ichikwa ezi na-ulo n'ime obodo
ECA -Komishon onodu aku na uba Afrika
FAO -Otu Unaited Neshons okwu nri na akom ugbo di n'aka
FSSDD -Ngalaba ihu na nri ruru oha na eze aka tinyere mmepe toro ato
G8 -Ogbako obodo asato bu akwaa akwuru na mmepe ma o bu ndi ndoostri Ha kwu chim.

GEF -Ego ikwado odimma gburugburu mba uwa
HIP -Atumatu maka obodo ubiam ji aka ugwo ha ji ka nku
IFBWW -Nchikota otu oru ulo na ndi oru osisi
MPLA -Ndi otu agha choro izoputa Angola
NASA -Ulo oru ihe na efe n'elu na ihu igwe di n'aka
UNDP -Usoro oru mmepe Unaited Neshons
UNICEF -Otu Unaited Neshons ji ego akwado odimma umuntakiri
UNITA -Otu choro ka Angola nwere onwe ya kpam kpam
USAID -Agensi ulo oru Amerika na –ahu m'aka mmepe obodo niile di n'uwa

USD -Ego ndi Amerika
WFP -Usoro ime ka nri zuo uwa onu
WWF -Ego e ji akwado odi mma ihe bi n'ohia uwa dum. 15

Page Navigation Panel

1 2 3 4 5 6 7 8 9
10 11 12 13 14 15

 

© 2002 Communicating for Change. All Rights Reserved
Developed by George Mbuagbaw