Go Back
Communicating for Change

Document Body Page Navigation Panel

Pages 1--13


Page 1 2
Radio
Vol II No 7 June 1999 [Igbo]

1
CHANGE
Ndinaya
Mmepe Nkeji Ole Ibe
IWELATA UFU UBIAM
Nduku Bu Ebe Ano Nkeji asato na tinkom 6 Otu ulo oru nwe onwe ha na Naijiria choro isi mba Kamerun
Iri abuo welata iku nduku

Ego Onwe Tinkom Iri ano na ise 12 Ihe dika okara ezi nulo nile n'Amerika na-eri ugwo ruru nde ise
Kwa afo.
Iwufe Oke-Ala Icho Uwa Oma Tinkom Iri ano na isii 12 Ndi mba Zimbabwe na-ezobacha na Saut Afirika maka ihe isi ike

di be ha
Ndi Na-Azu Ebe Tinkom iri abuo na ano 13 Izu ebe bu ihe oha na eze ji akpafu mgbe n'ime obodo Zimbabwe.

AHU IKE NA IHE NRI
Homon ime ahu: Nkeji ato na tinkom iri 7 Not Amerika na Yurop na-ebu ihu maka anu ehi. abuo na iteghete

Ihe Oriri Tinkom Iri abuo na abuo 12 Otu uzo n'ime uzo ano ga efunahu uwa dum.
Ndi Ogaranya A Nagharala Utu Isi Ahuike Otu nkeji na tinkom 5 Naani ndi ogaranya n'America na-enweta ezi nlekwa ahu ike. Iri abuo na ato

IBI NDU
Ebe Obibi Tinkom iteghete 12 Ebe mniri na-enyere uwa aka.

Ndi Oso Agha Na-Emekpa Saut Afirika Ahu Nkeji ana na tinkom 8 Nsogbu ndi oso agha n'Afirika abukwaghi ihe ochi Iri na asaa

Ntoala Ndi Ocha Toro Otu nkeji na tinkom 9 A ruru Nairobi ka o buru a kwaa akwuru. iri abuo na asato

OCHICHI
Ota Nisi E Butela A Jum Oru Na Nikaragua Otu Nkeji na tinkom 4 Ajum oru umu akwukwo Nikaragua choro ikwatu goomenti ala ahu ovu na ire

Ochichi Egbebere Otu nkeji na tinkom 10 nabata ndi inyom ga-ewelite ochichi egbe iri ato na asaa
bere ugo bere na Naijiria
MMUTA
Umu Afirika N'agu Akwukwo na UK na USA Tinkom iri abuo na 12 Ndi Afirika na-amu akwukwo n'Amerika adi ole? iteghete

MMEMME
Jun 16 1999, Ubochi nwa afo Afirika Otu nkeji na tinkom isii 4 Inyeghachi ndi agbada goomenti ga – anokpa ubochi a aka 1
1 Page 2 3
Radio Vol II No7 June 1999 [Igbo]
2
CHANGE
Nkeji Ole Ibe
Gburugburu MMEMME

Jun 5 Ubochi Ghurugburu mba uwa Otu nkeji na tinkom 3 Zoputa nu naani out elu uwaa anyi bi iri abuo

NDUIME OHIA
Enyi ji ogologo imi ya azo onwe ya Otu nkeji na tinkom 3 Enyi ji mi ya esite ebe onwu ya no were gbalaga iri ise

"Ebe Akwukwo" Tinkom iri na asato 12 Olee otu iga-esi akowa ebe akwukwo?
Nchekwa Gorilla Ugwu Riri Mperi 1min. 29secs 6 Onye njem nleghari anya e gburu na Bwindi ga-emekpa
oru nehekwa n'obodo ahu ahu.

EBE MMIRI
Ebe Mmiri Ndi Uwa Tinkom iri ato na ato 12 Na Saut Amerika ka e nwere ebe mmiri okaibe n'uwa dum.

Agha Yugoslavia: Ihe Ozo O Melara Otu nkeji na tinkom 3 Ka-aluchara agha Yugoslavia, agha ozo bu maka isi abuo
izoputa gburu gburu ha tupu oburu ogbunigwe
Ubochi Mmiri Uwa '99 1min. 7secs. 5 Ihe mmuta sayensi ohuru gosiri nkpa mgbanwe ihu igwe di mmiri

IBI NDU
Inya Odum Na Kambodia Nkeji abuo na tinkom 9 Kpoturu ezi n'ulo ji ogbunigwe ala eti epele iri ise na asaa

NCHEKWE NA OZUZU GBURUGBURU
Nkwuputa maka nchekwe, na nzulite gburugburu Tinkom iri abuo na isii 10 Ikpapu nsogbu gburugburu n'akuko bu ime ka o ka wanye ojo nihu.

Mpahara Nke Umu Ntakiri NDI MMADU
Akuko Senchuri a Tinkom iri ise na isii 11 Umu akwakwo puku iri abuo na Briten na-ako akuko mba ha n'ejije.
Kedu Nnunu Bikariri Ndu Ogologo? Tinkom iri ano na otu 11 E nweru nnunu ndu ya ka nke mmadu n'ogologo.

NDU IMEOHIA
Ihe Wotabok Ji Enyere Agu Iyi Aka Nkeji ano 11 Wotabok a gbalahula onwu n'aka agu iyi maka ndu ozoro ya bu anu iyi.

Gloziri 14
Akronims 14
2
2 Page 3 4
Radio
Vol II No 7 June 1999 [Igbo]

3
CHANGE
AKUKO
Jun 5: Ubochi Gburugburu Uwa Otu nkeji na tinkom iri na abuo
Iji cheta ubochi gburugburu uwa, n'onwa Jun, ubochi nke ise n'afo 1999, ndi otu mba uwa maka gburu bu
Yunaited Neshons Envairoment Program (UNEP) na-ario oha na eze ka a zoputa elu uwaa na ihe bi n'ime ya.

Ha dere n'akwuko ha si, "Onye obula n'ime anyi ga na-akpa agwa anaghi emegide elu uwa o bu naani ya ka-anyi nwere.

Na Mmemme nke afo a, isi okwu ya bu "Elu uwa anyi, Odi nihu anyi – zoputa ya," ga eji a sompi edemede, nzuko simpozia na ndi goomenti iku osisi were cheta ya.
Ubochi a burugooro ubochi gburugburu na-mba uwa dum ka eji echetara umu uwa uru I dota gburugburu ocha tinyere ime ka goomenti na ndi mmadu gbanwee ajo omume ha na – emeso gburugburu ma dote kwa iwu etiri
banyere gburugburu. Obasi Ogbonnaya/ UNEP

Imi Enyi Ji Agbalahu Onwu Otu nkeji na tinkom iri ibe Enyi na-akpa nri ma na ndu ha di n'aka ndi nta, ya mere ha ji akpachapu anya ma ehihie ma abali. O di
kwanughi mfe ka osi daa uda n'onu.
Ndi na-azo enyi ndu bu Serdilefants (STE) na bekee mere ihe nnyocha were kwuo na ihe mere enyi ji agbalahu bu na ha na-adi na mbu jikwaa usoro akpan nri ha.

Lain Douglas-Hamilton, onye isi oche ndi ulo oru STE Kwuru si, "ha na-eji agbugho mara na igbu oge ebe ndi
di nta na-anokari bu onwu, ya mere ha ji esi otu ebe nchekwa ha gafere ebe ozo naani n'abali.

Ndi na e ji redio achobu ha a mataghi udi agwaa ha na-akpa. Mana udi omumu a bu nke mbu na mbu e ji (GPS); Satlait global posishonin sistem na bekee maka i jide ha were me.

Na ruo kam lelee radio ahu, ha nyanyere enyi isi na ano ahu were na-eso njem ikpa nri ha otutu onwa. Nke a di iche mgbe ha ji redio e soghari enyi n'ime ugbo ala were amata onodu ha.
O dighi onye ma maka nkpagharia, enyi ji ime ndeli akpaghari. Mwaghari na-a masi ha nke oma. Ma na ugbu a, ndi okaa sayensi na-acho imata ihe ha ji amata ebe onwu ha no.
Di'Ekonomist.
Agha Yugoslavia-Ihe Ozo O Melara: Out nkeji na tinkom in abuo Ama agbaala maka ihe onye kuru onwuo a na-awunye na riva Danube. O bu maka agha a na-alu na Yugosla-via
ka uwa e jighi tinye uche na mkpamkpa kpara na Kosovo ohuru a.
E boro agha ehu inyi ahu awunyere na Danubu di ka akwukwo sin kwuo. Nani otu akwukwo ruru aka na o bu ebe owa mmanu gbapuru butere inyi ahu ma dokwaa aka na nti ka e kee nkwucha na Danube.

Ndi gburugburu idi mma na-amasi doro aka na ati maka oghom ga adagide ndi bi na mpahara ebe ahu. 3
3 Page 4 5
Radio Vol II No7 June 1999 [Igbo]
4
CHANGE
Dika Phillip Weller bu Dairektor oru nchekwa na nzulite onatarachi uwa WWF siri kwuo, "mmadu onodu a nyugoro anya na Yugoslavia di egwu, a hapu onodu a ko o gaa n'ihu, ya na okirikiri mba dicha na Balkan,
nsogbu o ga-ebute n'ihu ga aka nku.
Ya bu ngbadata Danube ahu na-enye ndi Yugoslavia, Bulgaria na Romania onu ogu ha kariri nde iri mmiri onunu.
WWF

JUN 16, 1999, UBOCHI NWA AFO AFIRIKA Out Nkeji na tinkom isii.
Otu mba uwa eguzobere maka umu ntakiri bu UNICEF na nkenka, e jiri la 'Omumu Udo' were mere isi okwu maka ncheta onodu umu ntakiri Afirika na-abia n'onwa Jun, n'ubochi nke iri na isii n'afo 1999.

Onu na-ekwuchitere otu a siri na o nweghi mmemme ha ga-eji cheta ubochi a na Naijiria.
O siri, "ubochi a hu gbasara goomenti. Nani ihe UNICEF na-eme bu iweputa isi okwu na inye ihe nkwado di ichi iche".

Ndi UNICEF na achikoba ihe ha ga-eke ndi ulo nta akuko na ndi otu ndi ozo choro icheta ubochi ahu. Ka o
si na di, UNICEF Naijiria na-elo ibughari ubochi mmeme a na Naijiria maka mmemme ochichi isi na aka ndi soja banya n'aka ndi agbada ga-adi n'onwa May 29.

Ebumnuche ha bu na mmeme a ga-emekpa ubochi nwa afo Afirika ahu. Obasi Ogbonnaya.
OTA N'ISI BUTERE NGAGHARI IWE NA NICARAGUA Otu nkeji na tinkom iri ato Onu mmanu ugbo ala na igu akwukwo no n'elu oji e butela ogba aghara na Nicaragua.

Nkpuru ubochi isii gara aga ka ha si na ngaghari iwe ndi oru okporo uzo gbara maka atumatu ota n'isi ahu ndi ofesi na-agbazinye ego siri ha bagide.
Ya bu ngaghari iwe a kwatu chaala goomenti Prezidenti Arnoldo Aleman na-acho enye m aka n'aka ndi ofesi.
Ogba aghara ahu Kwusira n'ubochi nke ano n'onwa May n'afo a site na nkwetorita goomenti na ndi na-akwo ugbo ala ka o banye.

Mgbe Aleman na-echeta ihe butere nkwusi ogba aghara o siri, "Nikaragua e gosila na nkwekorita ka tigbuo na zogbuo mma".
Site na nkwekoritaa, goomenti ga aga n'ihu ibagide atunmatu otan'isi ya, ka ma onu mmanu ga esi n'otu dola
na ego ise daruo otu dola na ego ato na ise.

Ndi ugbo alaa ruru puku iri choro ka onu otu galon mmanu buru naani otu dola.
Ajum oru na ogba aghara so ya riri ozu mmadu abuo, nari Kwuru nari mmadu meru chakwara ahu. O bidoro 4
4 Page 5 6
Radio
Vol II No 7 June 1999 [Igbo]

5
CHANGE
mgbe umu akwukwo choro ka e welite aka n'ego e ji akwado mahadum na bojet 1999. Otu onye nwuru mgbe ndi uwe ojii napuru umu akwukwo iweghara ulo oba ego obodo ahu.

Agitprop

JUNE 8 1999 Ubochi Mmiri Oshen Otu Nkeji tikom asaa Ka Ubochi ncheta mmiri oshen na-erute ka ndi uwa na-echeta uru oshen na ihe bi naya na abara ha, nnoycha
e mere gosiri na oriri temprecho na-ari na-emegide ihe bi na mmiri.
Ha siri na azu salmon na-anwucha na mmiri Not West Pasifik tinyere nnunu mmiri, alge na korals na-anwuchazi anwu abughi ndi na-aku azu na-ememila ha.

Nnyoputaa nyere aka igbochi ese m ni ihu di n'etiti Kanada na America na ebo onwe ha ebubo n'obu oke iku
azu ha na-aka butere uko ihe mmiri ahu.

Otu abuo na-abagide oru odi mma onatarachi mba uwa bu (WWF) Wold Waid Fond fo Necho na Televishon Trost fo di Envairomenti (TVE) ga-eweputa ihe nkiri onyoo nyoo ga egosi nnyoputa ahu. Ha ga ahu kwa na
oruru uwa dum aka. Obasi Ogbonna/ TVE

NDI OGARANYA AKPARALA NLETA AHU IKE Otu nkeji, na tinkom iri abuo na ato Ajaju na-echu ndi mba Amerika ura taata bu ka ha ga-esi mata na mbo goomenti na-agba iwelata utu isi ahu
ike obu naani ndi ogaranya ga-eri uru ya.
Ihe omumu ha mere, nke ha deputara n'a-kwukwo maka ahu ike helt Afez kwuru n'uzo ato n'ime otu nari nde dola goomenti ahu ji bagide atumatua bu ndi ukwu kacha rie elele ya.

Otu uzo n'uzo ano laara ndi na-eri ugwo onwa no ebe nde dola iri kwa afo.
Ka odi ugbua, ndi atumatua eruachi aka ma oli di ka otu onye n'ime mmadu ise n'Amerika dum.
"Ebe ndi a ruru nde ano na ato o rughi, o di nkpa ka atulee atumatua bu naani obere onu ogu ndi ala anyi na eri uru ya"

O bu John Sheils mere ihe omumu ahu kwuru nkaa. Deli Helt Kee niuz/ Agitprop
NCHEKWA GORILA UGWU RIRI MPERI Otu nkeji na tinkom iri abuo na iteghete
Mmadu asato e gburu na Uganda n'onwa mach gara aga, e meela ka uzo obodo a si akpa ego rie mperi.

O bu site n'ego ndi njem nleghari anya ezumike na-akwuta ka obodo a ji akpachapuru gorila ha bicha n'ugwu anya.

Obu otu n'ime onye nche aha ya bu Mazi Paul Wagabe ka e gbukotara ya na madu asato ahu mgbe ndi ogha ajum goomenti e chere na ha bu ndi Hutu Rwanda wakporo ndi Bwindi Impenetreteble Nashonal Pak. 5
5 Page 6 7
Radio Vol II No7 June 1999 [Igbo]
6
CHANGE
N'ime ndi nleghari anya ndi ahu, ndi Amerika di abuo, ndi Briten di ano ebe ndi Niu Zialand dikwaazi abuo. Ndi Uganda ano ka e gburu egbu.

A ma ohia Bwindi a ama make ebe obibi Ozodingba ugwu ruru nari isii na iri abuo bi. O bu ebe oru ndi Afirika Waild Laif Faundeshon (AWF) ji mere ebe nlekota na ozuzu ozodingba kemgbe uwa.
Ihe a wutere President AWF bu Sir Michael Wright' o siri, "O na e wute anyi maka ndi onwu na ekwe ndu ha onu ebe ahu tumadu onodu ozodingba" mgbe ana-aju ya ajuju onu.
Mgbe o dighi anya, o bu naani pak Bwindi bu ebe agha erughi ozodingba ahu. Ma ka o di ugbua ebe ndi ozo
ha bicha dika Uganda, Rwanda na Demokratik Republik Kongo na-akwa ngbo agha. African Wildlife Foundation

NDUKU: Ebe a no. Otutu ubochi n'ime onwa obula, nnukwu ugbo ala n'esi n'ime ohodo di na odida anyanwu Bamenda
Kamerun e buga nduku Naijiria, Gabon Ekwetorial Gini na Sentral Afrikan Ripublik. Agwa ohuru a turu ndi
Bamenda n'anya nihi na ya bu nduku bu ihe welitere onodu ebim ndu ha.

Ndi mugosiri ha uru nduku Airish bara bu ndi ulo oru Senta fo Intanashonal Potato Risach (CIPR) nogoro n'obodo a ato asaa. Nduku a n'aso uso ma eghekota ya na akwa, were mee nri ututu.

Ndi out oru mmepe Naijiria (DIN) otu nkporogwu ka bu n'ime obodo choro iku udi nduku ahu n'ime obodo Bechere na ebe a na-azu aturu di na stet Kros Riva.
Oriaku Caroline Ifeka bu onye isi ndi DIN – jere njem mmuta na Bamenda lotara si, "o bi bum so anughuri maka njem m si Kamerun loa. E jiri m anyam hu ihe nriba ama ndi CIPR na ndi oru ugbo ji nduku ahu aru
ebe ahu".
Oriaku Ifeka choputakwara na nduku ahu na-eme nka oma. Otu nari Kilogram na-emeputa otu nde kilogram.

Otutu ndi oru ugbo koo nye onu si ihe ruru otu nari ime obodo Bemanda ebidola iku ya bu nduku tinyere ugu Kabej, Yabasi na Karot. O hu kwara na nke ka enye ego bu nke a kuru n'udi a ga-eji kuo afo ozo
karia ndi na-aku ya maka iji me nri.
"O butela ngbanwe aku na uba, Ndi mmadu a nabatala usoro a. O bu site n'idi uchu. O gboola mkpa uko
oru bekee. Onye obula no n'ugbo ya ugbu a", di ka osi kwuo.

Na mbido Oriaku Ifeka Jere na Jos, ebe a na-ako nduku Airish ahu na Naijiria, ya na Nashonal Rut Krop Risach Institut (NC\ RCRI) ndi nnyocha maka iku ihe erimeri nkporogwu na Vom didewere Jos, na stet
platu.
O kwuru si, "Anyi choputara na mmiri na ezo na Bemanda Karia Jos. Nke a mere na ndi CIPR na akoputa ndi n'emekari nri karia nke ndi Jos. Ndi CIPR na ndi oru ugbo na-arukoritakwa oru onu n'oge Owuwe ihe
ubi". 6
6 Page 7 8
Radio
Vol II No 7 June 1999 [Igbo]

7
CHANGE
Otu ndi inyom DIN akuola ya bu nduku n'ime obodo Bechere ma ruokwa oba na ga na e dote ya n'usoro ntuzi aka e weputara. Ha nwere ezi olile anya. Ime obodo obula chokwara inwe ugbo nduku na.

Oriaku Ifeka kwenyesiri ike na oru a ga eweta ego ga enye aka gbochie mmeru gburugburu. O doziela onodu ndi oru ugbo na Bamenda. Ugbu a ha e sila n'ulo aja oto ruwa ulo gbamgbham kemigbe afo iri abuo
gara aga, ha na – eri nri ugboro ato n'ubochi, otutu umu ha na-agazi kwa akwukwo.
Nke ndi DIN ga-ebido ma ha matacha ego ole umu nwanyi ji na aka tinyere nke ezi n'ulo obula nwere iji were bagide ya bu oru.

Ha na-atu anya na o bido ulo oriri na onunu di ebe ahu ga na-azu ha ahia, tinyere ndi udi di na Enugu stet na ndi Makurdi di na Benue stet ga na-azu ha ndi a ga-ako ako. Ya mere o ji nwee nchekwube na oru ugboa
ga-agazikwa n'odida anyanwu saut Naijiria.
Ihe ndoghachi azu di na nduku ndi CIPR bu na ikuchaa ya nke ugboro ato, nke ano agaghi eme nri. Ihe i ga
eme bu ikpofu ha nile gazutakwa ndi ohuru n'aka CIPR. Obasi Ogbonnaya

Agha Homon Ime Ahu Nkeji Ato Na Tinkom Iri Abuo Na Ano. I ji homon were zu aturu nwere ike ibute agha n'etiti Amerika na Yuropian Yunion (EU). A maghi ma
anu aturu ndi eji homon were zuo a ga-ebutere mmadu oria. Nke a mere ndi EU jiri machie itubata anu e ji
ya zuo be ha.

Mmachia wutere Ndi Amerika na Kanada n'ihi na ha si na onweghi onye ji aka na onwere ihe anu aturu e ji homon zuo neme mmadu.

N'ime homon mpo isi e ji azu aturu n'Amerika, ato nime ha ka a na-atu egwu. Ha bu estradiol-17 beta, testosteron na progesteron. Ndi na-adiri onwe ha n'ime ahu mmadu na aturu.
Ndi EU na ndi Amerika kwekoritara na erie ya nke ukwuu na o ga e butere mmadu oria kansa. Mana ndi EU na-eti mkpu si na ya bu oria Kausa e si la n'anu a ju uwa.
Ha siri n'ihe butere ya bu na ndi America na e tinye kari one iwu weputara.
Otu Profeso bu okaibe na igba umu amumanu ogwu bu kwa onye isi ndi oru sayensi EU bu Johanna Fink-Gremmels na-eme nnyocha maka homon mpo na anu siri, "E nwere ihe e jimnaka na obu estradiol-17 beta
na-ebuta kansa ara."
Ndi EU na-ekwu na ya bu ogwu na egbu sel ime ahu DNA enwghi opekampe ahu mmadu choro ma ncha.
Ndi udi ikpe a di n'aka bu World Tred Organizeshon (WTO) ndi na-ahu maka azum ahia mba uwa dum
kpere ikpe laara ndi Amerika.

Ndi n'ahu maka nri na ogwu n'Amerika bu US Fud na Drog Administreshon (US FDA sikwara na, "E were awayoo tinye ogwu ahu n'okpuru nti aturu, na o nweghi ihe o na eme mmadu". 7
7 Page 8 9
Radio Vol II No7 June 1999 [Igbo]
8
CHANGE
Ndi ozo kpekwara ikpe si na ndi EU ekwughi ezi okwu bu ndi JECFA, o bu ha na ndi WHO no n'out komitii, FAO; ndi otu na ahu maka nri na akom ugbo. Naani estradiol-17-beta ka ndi IEFCA kwetere na o
na-ebute kasa.
Ha na-akowa na a gbasoo usoro ndi WTO weputare na nsogbu adighi. Ndi Amerika na ndi EU na eche ka nyocha ndi ozo mere puta tupu ha a malite kwa agha.
Di Ekonomist

Ndi Oso Agha Na-emekpa Sautan Afirika Ahu Tinkom iri ato na ise. Agha okwusi o bido n'Angola tinyere nsogbu si na ndorondoro ochichi na Sautan Afirika chuchara umu
mmadu n'ala nna ha, mere ka Afirika soro na ndi oso agha kacha n'onu ogu be ha.
Ndi oso aghaa kariri nde isii n'Afirika. Otutu n'ime ha si Sentral Afirika na Gret lek Rijon. Ha na-ebutere
ndi Afirika nsogbu nihi n'ubiam ji burii Afirika. Mgbe ufodu m ni okwu a na-eru obodo ha bi gbateta n' obodo ha no nime ya ezere ndu.

Ihe kariri nari puku isii si Angola gbalaga Namibia, Zambia na Malawi maka agha bidoro be ha n'onwa Aprel 1998.
Ndi Zambia nabatara nari puku abuo si Angola, Burundi, Demokratik Ripublic Kongo na Rwanda. Ndi Kongo na-aba Tanzinia onodu aku na uba ha magoro afo n'ala. Onu ogu ha ugbu a n'odida anyanwa
Tanzania bu puku iri ise.
Malawi so n'obodo dakarichara ogbenye n'uwa dum nabatara otu puku ndi si Somalia, Rwanda, Burudi na DRC. N'afo iri abuo gara aga, o nabatara ndi oso agha otu nde mgbe ndi Mozambik na-alu agha. Ndi
Boswana nabatara ndi Namibia puku ato si otesi kaprivi.
Ndi Mozambik, Namibia, Saut Afirika, na Zimbabwe so kwa kete ndi oso agha si Angola, DRC na Gret
Lek Rijon.

Ihe mwute di n'akuko a bu na onodu ndi a ebe di iche icha ha nocha bu echeta ebewe. Ihe kariri iri ka e gburu na Saut Afirika n'afo 1998. E boro ha ebubo ikpa aru di iche iche. Ndi Angola na-aru Zambia aka
na ha Kwudooro ndi no be ha ka ha kwatuo goomenti Angola. Zambia a gorola isi onwe ha. N'ogbako
ndi otu mba uwa okwu ndi oso agha di n'aka bu Unaited Neshons Hai Komishon maka Refujiis (UNHCR) gbakoro na Saut Afirika, Lucious Chikuni, bu Komishona na ahu maka nkwadebe oghom nlekota na

nnabata ndi oso agha na Malawi siri na ike agwula ndi Saut Afirika inyere ndi oso agha aka n'ihi nsogbu ndi ozo ha nwere be ha.

Nsogbu kasi ibe ya a na-enwe nilekota ha si n'otutu n'ime ha nwechara egbe ha ji azo ndoro-ndoro goomenti. Mgbe ufodu ndi a na e nweta ndonye ukwu goomenti ha no be ha Nke a butere anya ndi soja
obodo ha no idi na-eru ha mgbe dum. Nke a me kwara ndi okwua doro anya ji akpoku mba uwa ka ha bee nsogbua nkenke na be ha site "n'ichoputa ihe na'ebute oso agha, ibelata ya ma o bu ikwusi ya kpamkpam"
O bu phyllis Johnson, Onye isi Saut Afirikan Risach na Dokumenteshon Senta (SARDC), Ulo oru na
emennyocha na ndeko kwuru ya. Nesalink/ Afirika 8
8 Page 9 10
Radio
Vol II No 7 June 1999 [Igbo]

9
CHANGE
Nkomi Puru Iche Otu onye administreto si mba Briten e zigara ka o chiwa ndi Nairobi otutu mgbe gara aga nwere atumatu o
bu n'obi na o ga-enye aka welite onodu ndi owuwa Anyanwu Afirika ahu.
Ebumnobi ya bu ka aghara echefu aha ya otutu afo di nihu. Ihe o bu n'obi bu iguzobere ndi Nairobi iwu di iche iche. Kedu ka o si mee ya?

O degaara ndi obodo ya bu Blakbon laka-nshee di na U. K. akwukwo si ha zitere ya iwu obodo ha. Mgbe
o natara akwakwo iwu ahu, o nyere ya onye ji igwe etipiara ha ihe odide.

O siri ya, "tipia puta chaaram ihe n'ile e dere n'akwukwo otu e siri dee ya kama ebe obula ihuru 'blakbon' tapiagharia ya 'Nairobi'. O dighi otutu mgbe Nairobi e weela iwu obodo.

O dinghi onye huru mperi iwua riri N'aghanyeghi na Nairobi abughi obodo oyi.
Nani n'afo 1970 ka o doro ndi goomenti Kenya anya na ha aruwabeghi elu ulo be nka onwee ike igbochi akpa oyi snoo n'ada n'elu ulo
Immediet Teknoloji

Inya Odum Na Kambodia Nkeji abuo, tikom iri ise na asaa. O ga amasi gi ibi n'etiti ogbunigwe a na-eli n'ima ala? Ndi otu njem nleghari anya ezumike jere iji anya ha
hu ka o di na Kambodia. O tu nime ha dere maka otu ezi n'ulo bi ebe elichara mgbo ala ma na-aru kwa oru na ya.

"Naani ya na-aru oru ugbo inine ya. O gbagoo, o gbadakwa mgbe ufodu o kwusi lelee otu akwukwo nri ma o di ihe mere ya. O ka anwu di ubochi ahu tinyere otu ukwuo ma mwere, o ji osisi enyere onwe ya aka.
Ebere ya otu ukwu na mgbagote ukwu. Ebe o bu ebe Odida anyanwu Not Kambodia ka nwoke a
nagaghari n'ugbo ya, o putara na o bu mgbo ala main napuru ya otu ukwu.

"Eriri na-acha mmee mmee na ocha ochaka e ji gbaa be ya gburugburu, ubi inine ya, uzo o si eje ekuru mmiri na pompu na uzo osi a pu okporo uzo gosiri na nwokea bi ebe a na –eze eze maka mgbo main.

"Ede Kwara, 'Zeere Main' e kobere nukwu osisi obula, ogige obula na osisi obula di n'akuku be ya.
"Ka-anyi n'ele anya, otu nwatakiri nwanyi si n'ohia di n'azu ulo kpuru otu ehi na-aka ya o nyere nwoke ahu aka, ha abuo lawa be a ebe otu girigiri nwanyi na-eche ha.

"O di ka iji odum nya anyinya n'elu odum maka mainu n'ile ahu ga-emechaa na-agbawa si
"O dighi ebe ka ibe ya mma. Mgbe any bara okporo uzo anyi huru na ime mmiri, okpuru brij, ulo akwukwo, ulo uka, odo mmiri ma akuku uzo di cha ime main.

"Kedu ihe kara nwokea obi ibi ebu otu nzohie ukwu ga ekpochapu ndu ya? 9
9 Page 10 11
Radio Vol II No7 June 1999 [Igbo]
10
CHANGE
"Osisa ajujua, ahiaghi ahu. Onye ga ewe nwoke otu ikwu n'ugbo ya, kedu ihe o ga eji ebukoro ndi be ya na njwogwo ya gaa ebe main adighi ga biri.

"Bere ihe na nde main isii ka e liri n'ala Kambodia. Ndi okacha mara siri na o ga erucha afo iri abuo na ise
tupu a guputacha ha. Nari kwuru nari ndi oru ugbo, ndi soja, umu nwanyi na umu ntakiri ka ogbunigwe na edula mmuo kwa afo."

World Kansul Ulo Uka.
Okwu Nriba Ama Maka Nchekwa Onatarachi Na
Mmepe Obodo Na Gburugburu Tinkom iri na asato.
"Atiti na imeto gburugburu na-agba nto ala maka mmepe obodo mgba okpuru. Ala e mebiri taata a gaghi

emeputali nri echi. Mmiri e ji poizin gbaruo maka ikuta ihe mmiri osiso agaghi asachapu ma di kwa mma inye ihe mmiri ohuru n'oge…."
Barber Conable, Dairekto Jeneral Wold Bank Oge gara aga

Maka Ochichi Egbe Bere Otu Nkeji Na Tinkom Iri Ato Na Asaa "Ubiam ji otutu umu nwayi aka ojoo. Ha bu zi okpata aku n'ezi n'ulo ha. Ha na-elekota ma di ha ma umu
ha tinyere umu nnedi ma o bu umu nnadi binyere ha anya. Ibu a kariri ha. Ufodu nime ha adaala mba, ufodu na= aga n'ulo na-ario aririo. O dighi ka ha si kpokoba onwe ha onu, ha agughi akwukwo, ha
enweghi enyem aka, odighi oru ha ji kwance na-enye ha ego.
"Nsoghu bu na ugbu a na Naijiria, onodu aku na uba a joola njo. Ndi oji aka ojoo bu ndi bi n'ime obodo tumadu na Kano. Ufodu nime ha a nakwaghi ahu nri ubochi n'ihi na di ha e nwekwaghi oru. Nihi na obi
nwa na emekari ndi nne, obi anaghi ekwe ha si umu ha na nri odighi. Ya mere ha ji agaghari icho ihe ha ga
eri.

"Ugbua umu nwanyi na-azu zi ahia opekampe, ihe obula ha ga-eji emeghari aka. Ka a na aba ochichi ndi agbada, e kwesiri inye umu nwayi ego, e meghi otu a, odighi ochichi egbe bere ugo bere ga-ato ato."
Laila BuhariOnye Otu ndi okaa Ikpe Ngalagba Umu nwanyi Naijiria (FIDA) Kano.

Mpahara Umuntakiri Akuko Ka Ibe Ya. Tinkom Iri Ise Na Asato. Na Yunaited Kingdom (UK) umu akwukwo kariri puku iri abuo si ihe ruru nari ulo akwukwo abuo a
bolitela usoro ndi gbooo ji ejije ako akuko n'onyonyoo. Ha kporo aha akuko ha, "Akuko obodo anyi"
Ha na ako akuko a n'ihu ndi nkiri no n'ulo ejije na-erite mmadu nari ise na London Milenium Dome.
Ka o si di, akuko nkiri a mara mma mana o nwere otu ihe nkiri onyoonyoo ndi stirlin obodo di na Skotland bu kwa out aka ahu. Ya bu na o bu iji were tube ndi bidoro nke Skotland ugo si ha daalu maka echiche
oma ha ka ndi a jiwere buru ndi izizi bidoro ya na Milemium Dome LondonPres Savis

Ihe Wotabuk Ji Nyere Agu Iyi Aka Nkeji Ano Oge gara aga, ka mmadu putara uwa bido icha nta anumanu nile na-atu agu obunadi mmadu na-atu ya bu
agu ujo maka ike na ebube ya. 10
10 Page 11 12
Radio
Vol II No 7 June 1999 [Igbo]

11
CHANGE
Mgbe ahu, wota bok so kwa anu ndi ozo agba oso ndu nihu na ha nile bikoro onu. Naani enyi na-akwudoli ya ogu. N'ih na agu di ike nke ukwuu, anu ukwu na anu nta bu ihe oriri ya.

Otu ubochi ka wotabok na-agba aso ndu maka agu. O nyoputere akuku mmiri otutu ihe oriri bu aturu tawa
were kpebie na ebe ahu ga a buzi ebe obiba ya.

N'otu ntabi anya o nuru olu na eti mkpu akwa na enye m'aka. Ka o lere anya o huru otu agu iyi alaka osisi tidoro n'alu. Agu iyi ahu yoro ya si, "Buko, nyere maka, a yoom gi, I hapu m ngaa, aguru ga-egbu m.

Wotabok maara na agu iyi e nweghi oyi. O buru na o kpachapuchi anya agu iyi ahu nwere ike igbu ya. Mana, oma iko biara ya. O siri agu iyi ahu, "Amam n'inwere ike nke ukwu, ma mhapu gi ebea I ga anwu.
A gam enyere gi aka ma i kwere otu ihe."
Agu iyi sara ya si "rio ihe obula masiri gi, onye ebere ya di ukwu, a gam e ji ya gbanwere ndu ni"
"Mgbe obula oke ekpomoku di ma obu mgbe ndi iro m na-achu m oso., iga ekwe mbata n'ime mniri ahu ibi na ya n'enyeghi m nsogbu obula"

Ka agu iyi kwere agbamndu a, wota bok ji mpi ya liligide bupuru ya osisi ahu.
Mgbe agu iyi gwuuru mmiri na-apu o siri ya, cheta nkwa ikwere mo, I laa azu na ya, o gaghi adiri gi mma.
Ya mere na ruo tata, mgbe o bula agu chuwara wotabok, o gbakpuo mmiri. O maara na agu iyi agaghi emebi nkwa ya, obunadi ujo o na atu ya maka ike ya
Mgbe Hippo gbara aji
Ole Nnunu New Karichara Ndu Ogologo Tinkom Ano Na Otu Iza ajuju a adighi mfe nihi na odighi onye ji mgbe a muru nnunu n'ile di ndia n' aka. Nani ndi no nga na zuu,
ma o bu be ndi mmadu ka a maara na ha na anoru iri afo asato.
Nke ebunuuche na o bu ya nokarichara ogologo ndu bu nke dika ichoku bu sulfa-Krested Kokatoo. o bu ndi turu ya nga be ha site afo 1902 rue 1982 o nwuru bara ya "koki"
Chongololo

Okwu Ndi Bara Uru Maka Erimeri Tinkom Iri Abuo Na Abuo Kengbe afo iri, otu uzo azu n'uzo ano nile di nuwa si n'ime mmri, na n'aka ndi na-ako ugbo azu eru uwa
aka. Nke a di mkpa n'ihi na o bu site n'azu ka ndi ogbenye ji e nweta protin. Ugbua ndi oru mmpe di iche iche na e memila chazi ha.
WWF

Obe Obibi Tinkom Iteghete Mmadu no n'uwa kariri bilion ise. E kee ha uzo iri, otu nime ha bu na mmiri ka ha si enweta ihe oriri
WWF 11
11 Page 12 13
Radio Vol II No7 June 1999 [Igbo]
12
CHANGE
EBE MMIRI NDI UWA Tinkom iri ato na ato Ebe mmiri oka ibe n'uwa di ise, nke Pantanal di na latin Amerika, nke Kongo/ Zaira Besin na Sentral
Afirika, nke owuwa anyanwa Ostrelia, nke riv Mekong di na Owuwa anyanwu saut Asia na riva China
Nke kacha ha niile bu nke Pantanal. Obodo ato na eke ya. Ha bu Brazil, Bolivia na Paraguay. Naija Delta
Naijiria gbara nke ato nuwa dum.

EGO ONWE Tinkom iri na-ano I ma na ndi na-aru oru n'Amerika di nde iri iteghete na-eri ugwo onwa ruru dola puku iri ise kwa afo. Ine o
putara na naira bu nde naira ise kwa afo
Agitprop

"Ebe Akwukwo" Tinkom iri na asato Ajuju – Gini bu ga "ebe akwukwo"
Aziza – Ha bu ebe iwu guzobere maka nlekota onatarachi na anumanu a na-azu azu. Nke a bu egbe onu nihi
na o tu esi wuo ya ka ono ruo taata. WWF

UMU AKWUKWUO AFRIKA NO NA UK NA USA Tinkom iri abuo na Iteghete Out mba uwa okwu agum akukwo, Sayensi na omenaala( UNESCO) di naka, na ndi ogbo ha okwu ndi oso
agha di naka bu (UNHCR) kowaputara na umu afo Afirika na – agu akwukwo na UK na Amerika di puku iri na otu. Otutu nime ha si mba Kenya na Naijiria.

Umu afo Afrika no Amerika agu akukwo kariri ndi no UK uzo abuo. Bere iha na pasenti iri ano si owuwa anyanwa Afirika
Niuz link Afrika
IWU OKE ALA MAKA IHE ISI IKE Tinkom iri ano na isii Uko oru na anyu ndi zimbabwe. ikpakwu ugbua a e meela ka ha were abali na – amikpu Saut Afrika.

Mmadu iri na asato nwunyuru anya mgbe ha zoro nime akpati oghere ikuku adighi mgbe ha si Boswana aga Saut Afirika.
Goomenti hai komishon Saut Afrika gooro onu ha si ha na nyere ndi Zimbabwe onu ogu ha di puku iri ato na isii ikike visa n'onwa iteghete n'fto 1998.
Ha kwakwara na site nafo 1996 rue 1997 ndi Zimbabwe zofuru n'ime Saut Afirika ka ha banyere obodo ahu di nari puku abuo.
Niuz Afrika
NDI NA-AZU EBE. Tinkom isi abuo na ano Izu ebe na-ewu nime obodo Zimbabwe. Ndi na-azu ebe ebe ahu ruru puku isii. Ha ji ya eche oji, were
kwa ya na-eme nri. Ha na-ere kwa ya n'ahia, were ego ya n'egboro mkpa. Intamidiet Teknoloji 12
12 Page 13
Radio
Vol II No 7 June 1999 [Igbo]

13
CHANGE
GLOZRI KANSA -etuto n'eto n'ime ahu si n'obara agbasasi nime ahu mmadu.

HOMON -mmiri ime ahu mmadu. O rue n'ime ahu osisi ma obu mmadu o nwere oru o na-aru.
AKRONIMS AWF -Afrika Waild Laif Foundeshon – out n'ahu maka odi mma anuohia n'Afrika

CIPR -Senta Fo Intanashonal Peteto Risach – Ulo oru nnyocha maka nduku
DNA -dioxibonukleik Asids
EU -Yuropian Yunion – Ndi out mba ofesi
FAO -Fud na Agrik Organizeshon – Out na-ahu maka nri na iko ugbo
GPS -Global Pozishonin Sistem – Ngwa orie ndi oka mmuta sayensi
FOA -Fud na Drog Administreshon – Out na – echekwa ka esi eri nri na ogwu.
JEFCA -Joint Komitii ndi WHO na FAO maka Human Efeks of Vetinari Drugs Out na – ahu maka ahu ike n'uwa dum na ndi out ha na-ahu maka nri na iko ugbo maka ihe mmadu
na-eme ogwu anumanu
NGO -Ndi oru onwe
NRCRI -Nashonal Rut Krop Risach Institut – Out oru nyocha maka mkporogwu osisi
SARDC -Saut Afrikan Risach na Dokumentashon Senta – Ulo oru nnyocha na nde ka mba Saut Afrika

UNESCO -United Neshons Edukeshon, Sayentifik na Kulchural Oganizeshon. Out mba uwa maka igu akwukwo, sayensi na omenaala.
UNHCR -Yunaited Neshons Hai Komishon Maka Refujiiz. Out mba uwa na – ahu maka udi oso
agha

UK -Yunaited Kingdom – mba otesi, isi ala Britain.
USA -Yunaited Stets Amerika
WHO -Wold Helt Organizeshon
WTO -World Tred Organizeshon 13

Page Navigation Panel

1 2 3 4 5 6 7 8 9
10 11 12 13

 

© 2002 Communicating for Change. All Rights Reserved
Developed by George Mbuagbaw